



































Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji


Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 1 

NRQ D{KA MGBAAMA N’EJIJE IGBO XFQDX: OBIDIYA, NWATA BULIE NNA 
YA ELU  NA OGBU MMADX NDX NA-AGX 

 
 

Olekaibe  Chinenye .C. 
Federal University of Technology, Owerri 

 
XM{  
 
Nd[ Igbo bx nd[ na-anagh[ eji omenaala ha egwu egwu ma bxrxkwa nd[ hxrx nrq d[ka xzq 
e si ezi ozi bx nke mere ha ji were ya kpqrq ihe. Nke a kpatara na onye Igbo rqq nrq na-
edogh[ ya anya, q gawa na dib[a [chqpxta ihe q pxtara. Q na-eme nke a iji gbochie qdachi 
nwere ike isi na ya pxta ma nabatakwa ihe qma ga-esi na ya pxta.  Nke a mere ka 
ebumnuche nchqcha a bxrx [chqpxta ma nrq q bx mgbaama n’eziokwu, ya na etu a ga-esi 
amata ama nd[ ahx site n’ihe nd[ mmadx derela n’ejije Igbo.  Ihe e ji mee nchqcha a bx 
akwxkwq ejije Igbo bx nd[ a hqrqla nke gxnyere, Obidiya nke Akqma dere, Nwata bulie 
nna ya elu nke Nwadike dere na Ogbu Mmadx Ndx na-agx nke Ben Igbokwe dere. Site 
na nchqcha e mere, a chqpxtara na nd[ Igbo na-eji nrq kpqrq ihe n’eziokwu, na nrq bx 
ugegbe e ji ahx ihe ga-eme n’qd[niihu, na ihe e ji ama nrq ga-eme eme bx etu o si emetxta 
n’ahx, na nrq niile a hxrx n’ime akwxkwq qgxgx nd[ a b[ara na mmezu bx nke gos[r[ na 
nrq so n’otu xzq e si agba ama maka qd[niihu. N’ikpeazx, onye nchqcha chikqtara 
nchqcha a site n’inye ndxmqdx ka mmadx niile jiri nrq ha kpqrq ihe ka ha nwee ike 
[gbalahx qdachi nwere ike isi na ya pxta ma nabata nke qma sikwa n’ime ya. Ma nke ka 
nke bx [kxziri qgbq na-ab[a n’ihu mkpa q d[ iji nrq eme ihe. Qzq abxrx na nd[ odee ugbu 
a ga-akwalite nrq n’edemede ha ka qgbq nq ugbu a mata ihe ekwe na-akx. 
 
 
MKPQLITE 
  
Agxmagx abxgh[ qb[ara qhxrx n’ala Igbo. Q bx ihe ya na Igbo so bido mana ihe d[ iche 
abxrx na q bx agxmagx qnx ka e nwere tupu qb[b[a nd[ qcha. Q bx nd[ qcha bx nd[ kxziiri 
any[ etu e si ewere agxmagx qnx a tinye ya n’xzq ederede.  Agxmagx nwere ngalaba atq: 
Abx, Iduuaz[ na Ejije. 
  
Chinagqrqm (2013) kqwara Agxmagx d[ ka ederede maqbx ekwurekwu e jiri asxsx chqq 
mma, nke na-enye qgxx maqbx qnxx obi a]xr[ pxrx iche. Q gakwara n’ihu s[ na agxmagx 
anagh[ akwxrx ch[m maqbx chakee achakee ma q bxrx na a gbasogh[ usoro na xkpxrx nd[ 
d[ mma n’itinye ya n’qnqdx o kwes[r[”(pg.6). 
  
Okoro (2012) si na Agxmagx bx “echiche miri emi nke mmadx q bxla chere banyere otu 
isiokwu, ma bia were si na  nkqwa asxsx na echiche a echere na-apxta ihe n’xd[ iduazi, 
ejije na abx (pg.6). 
  
Moondy (1982) n’aka nke ya hxrx agxmagx d[ka echiche na-esi n’ime mmadx apxta n’ihi 
mmas[ mmadx nwere n’[kq akxkq”. Echiche a na-egosi na xd[ akxkq ga-esi mmadx n’ime 
apxta ga-abx ihe nd[ na-eme na gburugburu ya na etu o si ahx ihe xwa.  Ya bx agxmagx 
bx ugegbe mmadx ji ahx ihe na-eme n’obodo. Ihe nd[ ahx nq n’obodo q na-ahx bx 
omenaala ya. Nke a mere ka omenaala bxrx qd[bend[, isi a hxrx kwawa okpu ma bxrxkwa 
isi sekpx nt[ na mba niile nke nd[ Igbo so n’otu n’ime mba nd[ a. 
  



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 2 

Kalx (1978) kqwara omenaala dika otx nd[ si ebi ndu ha.  Q gakwara n’ihu si na q bx ihe 
akpachapxrx anya hazie, weputa ma nyekwa qsisa gbasara xzq obibi ndx ndi nwe ya 
(pg.3). 
  
Omego (2006) kqwara omenaala d[ka usoro mmadx kwes[r[ isi akpa agwa bx nke a na-
amxta site n’aka nd[ mmadx nq n’obodo  ma nyefekwaa ya n’aka nd[ nke na-ab[a n’ihu 
(pg.169). Nke a na-egosi na ihe niile nd[ Igbo na-eme site n’omenaala bx ihe bidoro na 
gboo ma bxrxkwa nke nrq so n’otu n’ime ha. Qtxtx nd[ mmadx ekwuola qtxtx ihe 
banyere nrq. Na nchqcha a, onye nchqcha chqrq [mata ma q bx eziokwu na nrq bx 
mgbaama ihe ga-eme n’ihu na etu a ga-esi amata ama a. 
 
IHE NRQ BX 
 
Nrq bx ihe nd[ na-eme na ndx mmadx oge q na-arahx xra maqbx ihe mmadx na ahx n’xra.  
Ihe nd[ ahx nwere ike [bx ihe ga-enye ya obi a]xr[, [kpasu ya iwe, itinye ya xjq n’ahx 
n’ime nrq. Mmadx nwere ike [hx qtxtx ihe q na-ahx n’ime xwa na nrq ma q bxkwanx ihe 
nd[ q na-ahxbegh[ mbx. Mmadx nwekwara ike na-aga qtxtx ebe d[ iche iche na nrq ma 
ebe q garala mbx n’xwa maqbx ebe nd[ q na-ahxbegh[ kamgbe o ji pxta xwa. 
 
Mmadx nwere ike [rqcha nrq teta cheta ya maqbx chefuo. Ihe niile e kere eke na-arq nrq 
ma mmadx ma anxqh[a. Q bxrx na [ hxtxla nk[ta ebe q na-ehi xra [ ga-aghqta ihe m na-
ekwu. Oge xfqdx o meghar[a xkwx ma q bx aka ya ma q bxkwanx welie qdx ya elu nke 
na-egosi ihe nd[ q na-eme n’ime nrq. Etu ahxkwa ka q d[ na mmadx. Mmadx nwere ike 
isi n’ime nrq tiri mkpu, tipxta na mpxta maqbx n’[he.  
 
Nrq bx ihe mmadx na-amagh[ maka ya ruo mgbe q ga-ezute ya n’xra. Nrq bx ihe na-eme 
n’ime mmxq bx nke kpatara na oge xfqdx mmadx anagh[ enwe ike nke aka ya iji zqpxta 
onwe ya n’ihe qjqq xfqdx na-adakwas[ mmadx na nrq maqbx  hapx ime ihe q chqgh[ ime. 
Nke a mere Igbo ji na-ekwu okwu s[ na nrq bx onye nzuzu. 
 
Akwxkwq nsq so n’otu ihe ji nrq kwara ngwa qrx. Chukwu na-esite na nrq ekpughere nd[ 
mmadx qtxtx ihe d[ka o meere Josef nwa Jekqp bx onye a kpqrq onye qkanrq bx onye 
xmxnne ya jiri iwe refuo n’ala Ijiptu ma o mechara bxrx pra[m minista d[ka o si rqq na 
nrq. (Genesis 37:5). 
 
Qfqmata (2004) si na nrq bx njete aka mmadx na-ejete n’ime xra q na-arahx nke onye ahx 
ga-anqzi n’ime ya na-ahxzi onwe ya ebe qzq, n’xd[r[ qnqdx ihe d[ka nrq (pg.241). Q 
gakwara n’ihu s[ na nrq d[ xzq atq, nrq qma, nrq qjqq na nrq [ba. Nrq qma bx xd[r[ nrq q 
na-abx mmadx nqrq n’ime ya, q na-ahxta onwe ya n’etiti ihe qma. Nrq qjqq bx qnqdx 
qjqq, qdachi qjqq, izuzu qjqq nakwa mmegide qjqq na-adakwas[ mmadx oge q nq na nrq 
ebe nrq [ba bx xd[ nrq mmadx na-arq oge q na-ar[a qr[a [ba. 
 
Eziqcha (2001) kqwara nrq d[ka q natara chi, q s[ na nrq bx ebe mmadx, Chukwu na nd[ 
mmxq ozi na-enwe mmekqr[ta ma bxrxkwa xzq mmadx na-esi anata ozi site na chi. Q 
kpqrq nke a nrq ime mmxq (pg. 23) 
 
Baddeley (1980) kwuru na ndx na-anagh[ arq nrq bx ndx mmehie. (P. 105).  
 
Oxford Advanced  Learner’s Dictionary (1948) kqwara nrq d[ka emume ma q bx 
mmetxta na-eme na ndx mmadx oge q nq n’xra. American Heritage Dictionary of English 
Language kqwara nrq d[ka echiche maqbx mmetxta na-aba n’obi mmadx n’amagh[ ama 
oge mmadx na-ehi xra (pg. 354).  



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 3 

Domhott (2002) kqwara nrq d[ka ihe na-eme n’ime mmxq. Q s[ na nrq na-ebido n’ihe 
enwegh[ ihe q bx tupu q banye na nd[ gbara qkpxrxkpx. Q gakwara n’ihu s[ na nrq nwere 
xd[ d[ iche iche nke gxnyere iyi egwu, ihe mgbagwoju anya, [ga njem nchqpxta na inwe 
mmekqr[ta nwoke na nwaany[. O mechiri okwu ya site n’[s[ na onye na-arq nrq enwegh[ 
ike n’ebe nrq q na-arq d[. 

 
NKWENYE ND{ IGBO BANYERE NRQ 
 
Nd[ Igbo kwenyere na nrq. Nke a mere ha ji ahx nrq d[ka xzq e si anata ozi n’aka nd[ichie 
lara mmxq ma q bx nd[ mmxq n’onwe ha. Nd[ Igbo anagh[ eji nrq egwu egwu qkachas[ 
mgbe ha rqrq ihe qjqq na nrq. Osuagwu (1981) s[ “Nd[ Igbo nwere nkwenye d[ iche iche 
na-eme ka qtxtx nd[ mmadx na-eje na dib[a wee chxq aja d[ iche iche mgbe ha rqchara 
nrq. Xfqdx nrq nd[ a bx anx qh[a [chx mmadx qsq na nrq. Ha kwenyere na onye anxqh[a 
chxrx qsq na nrq na q bx ihe siri ike ga-ezute onye ahx. Q bxrx na mmadx ekpokqta ego 
na nrq, e nwere nkwenye na onye ahx ga-atxfu efo”. Echiche a gos[r[ na nd[ Igbo ji nrq 
kpqrq ihe n’ihi na ha kwenyere n’xd[ nrq mmadx rqrq na-egosi xd[ ihe ga-adakwas[ onye 
ahx. Nke a mere na mgbe q bxla onye Igbo rqrq nrq qjqq, o teta n’isi xtxtx, o hie aka n’isi 
ya, gbapx xlxaka, gbxpx asq mmiri s[ Chineke ekwekwala ihe qjqq tupu q mara ihe qzq q 
ga-eme n’ihi na Igbo na-ekwu okwu s[ na-ekwe na mmadx bx ekwe na mmxq. Ma q bxrx 
ihe qma, q ga-atxrx nd[ichie obodo ha mmanya ka ihe qma ahx rute ya aka. 
 
NRO DIKA ESI HX YA N’ EJIJE  IGBO XFQDX 
 
Obidiya 
 
Obidiya (Akqma, 1977) malitere site n’[kqrq any[ maka esemokwu d[ n’etiti Qnxma na 
Oriakx. Esemokwu a malitere mgbe Oriakx bx onye hxrx onwe ya d[ka onye kpatara ego 
chqrq [nara Qnxma ala ya n’ihi na o nwegh[ ego. E buuru okwu a gaa xlqikpe. Mgbe e 
kpechara ya, ikpe laara Qnxma ma Oriakx jxrx iwere ihe majistreti kpere n’ikpe, ]xq iyi 
na ya ga egbu Qnxma n’xzq egbe na mma. 
 
Tupu nke a emee, Obidiya bx nwunye Qnxma rqrq nrq were kqqrq di ya.  Q kqqrq ya nke 
a mgbe ya na di ya na-akpar[ta xbxbq banyere nd[ enyi di ya, di ya chqrq [ga leta. 
 
Obidiya: Q gagh[ abx ugbu a. Ala d[ qkx, Oriakx nwere ike izi  

nd[ mmadx ka ha chee g[ n’xzq gbuo g[. Echefuela m [ kqrq g[ otu nrq m 
rqrq nwanne echi gara aga. 

Qnxma: { rqrq g[n[? 
 
Obidiya: Q na-eme m ka q bx na mmadx ka q bx na nrq. { nq na- 

asa ahx, sachaa, na-abq isi. Dimkpa mmadx atq abata ebe ahx, bulie okpiri 
kxq g[, [ daa n’ala na-agba s[kq s[kq. Ha emie ala. Etiri m mkpu. Nd[ 
mmadx aza. 

 
Qnxma: Nrq a d[ njq, mana onye e ji rqq nrq abxgh[ onye ihe a rqrq na-eme (ihu 5-

6) 
 
N’akwxkwq a, Qnxma kwetere na nrq a d[ njq ma o nwegh[ ihe o ji ya kpqrq. 
 
 
 
 



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 4 

NWATA BULIE NNA YA ELU 
 
Nwata bulie nna ya elu (Nwadike 1992) malitere site n’[kqwa ezinaxlq Iloka na qb[b[a 
Onyenkuzi nwa ya bx Emuka b[ara ikpesa maka agwa Emuka n’xlqakwxkwq. 
N’agbanyegh[ ar[r[q nne Emuka bx Ahxdiya r[qrq nwa ya ka q gbanwee agwa mana ar[r[q 
ya am[tagh[ mkpxrx q bxla. 
 
Otu xbqch[ Emuka si qrx na-alqta wee zute nd[ enyi ya abxq, Okoroigwe na Madxmere 
bx nd[ mere ka q ghqta na xd[ ndx q na-ebi n’xlq nna ya abxgh[ ihe kwes[r[ ya. Nke a 
mere ka Emuka nwee mkpebi na ya ga-agwa nna ya ka o nye ya akxnaxba nke ruuru ya 
ka ya wee nwee ike itinye isi ebe qkx na-enwu n’elu gaa biri ndx etu q mas[r[ ya. Nna ya 
mechara nye ya ego nke ya. Q wee tinye isi n’obodo a na-akpq Ogbund[qma ebe ya na 
xmxnwaany[ na nd[ otu senti bqtxlx nqrq kpqq akx nna ya qkx.  Mgbe ego ya gwxrx, 
Emuka gara were qrx [zx xmx anx n’aka otu  onye qgaranya nq n’obodo Ogbund[qma. Ka 
ya n’ihe xwa nqzi na-ekwe n’aka ka nna ya Iloka rqrq nrq gbasara ya. 
 
(N’xlq Iloka q nq n’xra, rqq nrq ebe q hxrx Emuka nwa ya) 
Iloka: (na nrq) Emuka 
  Emuka a a . 
  Q bx qsq ka [ na-agba? 
  { gbarachaa, 
  { lqta 
  A na-agbalahi otule  n’qsq? 
  Ma ka m jxqkwa g[;  
  Kedx nke [ d[zi etu a? 
  Kedx nke [ tachara ahx etu a 
  taba n’qkpxkpx? 
  { na-erikwa nri? 
  Uwe q gwxla n’ah[a? 
  Ncha q gwxla n’ah[a? 
  Q q g[n[? 
  Ego m bunyere g[ 
  q gwxla? 
  ya gwxla, 
  lqtanx 
  maka na mmehie ad[gh[ 
  mgbaghara anagh[ ad[. 
  A na-ajx nwa ajx? 
  ya ka nd[ ala any[ ji aza aha 
  Ajxnwa 
  E jirichaa otu aka tie nwata ihe, 
  e jiri aka nke qzq 
  dubata ya, 
  hichaa ya anya. 
  Lqtawa, 
  Ejikwala anya ihere anwx. 
  Q bxrx na [ mxrxla akq, 
  Lqtawa b[a bara onwe g[ uru 
  Ezinaxlq m bx nke g[ 
  Lqtawa maka gidigidi bx ugwu eze 
(O teta, chakas[a anya, chqpxta na ya nq n’nrq) (ihu 59-60) 
 



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 5 

Ka Iloka rqchara nrq, nwunye ya bx Ahxdiya rqkwara nrq nke ya. 
 
Ahxdiya: Di m, 

chefuo ihe nd[ mere mgbe ahx  
cheta na q d[gh[ mgbe q bxla obi nwa anagh[ eti nne. 

  Biko di m, 
  Olee ihe a ga-eme? 
  Obi agbawaala m. 
  Naan[ nrq qjqq nrq qjqq ka  
  m na-arq 
  gbasara ya bx nwata 
  N’abal[ 
  arqrq m ya nrq 
  ebe o tukwu n’ukwu osisi, 
  mmiri ana-ama ya. 
  Q kwxs[gh[ ebe ahx 
  Q nqkwa na-ar[q ar[r[q 
  nri, na-ebeku g[ bx nna ya 
  Biko 
  Olee ihe any[ ga-eme? 
  (ihu 63-64) 
 
OGBU MMADX NDX NA-AGX 
 
Nke a bx ejije si n’aka Igbokwe (1995) bx nke malitere site n’[kqrq any[ xd[ nrq Mama 
Obodo rqrq bx onye na-achqgh[ ka nwa ya hapx [lx nwaany[ q chqrq ka q lxq. 
Mama Obodo: (na-ata atx) 
   Ama m ihe na-atx m 
   egwu oge q bxla m  

rqrq xd[ nrq a,  
Anagh[ m arqcha nrq  
ya aghara imezu etu ahx  
m siri rqq ya   
(ya amaa xsx gbaa aka ya) 

   Txf[a! 
   Nwannxnnx ahx na-abx  

ya bee mmadx anwxq  
ebezila qzq.  
Ihe a bx kpqmkwem xd[ nrq  
ahx m rqrq nke  
kpatara qnwx di m  
nke ahx bx ihe d[ka afq  
atq gara aga. 

   Nrq a ga-enwer[[r[ ihe ga- 
ejikq ya na omume edogh[  
anya nke Obiqma nwa m  
na-eme ugbu a. 

   Egwu d[ m, 
   q bxgh[ naan[ m  

n’ihi na agwq naan[  
otu onye hxrx na-abx eke. (ihu P.6.) 

 



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 6 

IHE ND{ A CHQPXTARA SITE N’AKWXKWQ EJIJE IGBO A HQQRQ 
N’ime akwxkwq atq nd[ a, nrq niile a rqrq n’ime ha gbara ama ihe mere n’qd[niihu. 
 
Xjq bara n’ime nd[ niile rqrq nrq n’ime akwxkwq atq nd[ a nke mere ha ji chqwa xzq 

mgbapx ihe a ga-eme gbochie ha ka ha ghara imezu. Nke a pxtara na ha ji ya 
kpqrq ihe. Obidiya mere nke a site n’igbochi di ya [ga ileta nd[ enyi ya n’xbqch[ q 
chqrq [ga.  

Qnxma: Na Sqnde – ah[a, aga m eje ileta nd[ enyi m n’Xmxabal[. 
Obidiya: Q gagh[ abx ugbu a, ala d[ qkx. Oriakx nwere ike izi nd[ mmadx ka ha 

chee g[ n’xzq gbuo g[. (ihu 5).  
Iloka mere nke a site n’[gq qfq maka mgbochi qdachi q bxla. 
Iloka: Chei! 
  Chukwu daalx ka q bx na nrq 
  Xd[ ihe a m hxrx bxrx na 
  mmadx, nsogbu ad[. 
  Txf[akwa! (ihu 60) 
  (Q gaa bupxta akpa Agwx ya, wepxta qfq gqwa, kxwa  
  n’ala) 
  Chukwu ab[ama 
  Ekwekwala m fuo nga ihe m furu 
  Ekwekwala obi nwambaash[ 
  gbuo nke m. 
  Ekwekwala m da nga ihe m 
  dara. (ihu 61-62) 
 
Mama Obodo mere nke a site n’izi ozi ka a kpqqrq ya nwa di ya bx onye o chee na ya ga-
esi n’aka ya nweta enyemaaka etu a ga-esi mee ka q d[ mma. 
 
Mama Obodo: Biko di m qma 
   gbaghara m 
   maka nsogbu m na-enye g[ 
   Awq anagh[ agba qsq  

ehihie n’efu 
Ihe mere ede 
o jiri bee nw[[ 
Biko nqrq ala. 
(ihu 8) 

 
Ha niile nwere ihe mmetxta bx nke tinyere ha araume, ezuike n’ahx mere ha jiri chqwa 
xzq mgbapx, bxkwanx etu e si amata ama a n’ihi na nrq bx ihe mmxq, q bxgh[ ihe 
anxahx. 
 Nrq niile a b[ara na mmezu. 

N’Obidiya, Oriakx mechara zie nd[ mmadx ha b[a gbuo Qnxma d[ka Obidiya rqrq 
na nrq. 

 
Qnxma nq n’xlq ya na-abq isi, chepx azx n’ezi. Nd[ ogbu isi abata kxq ya okpiri n’olu, 
were akwa kechie ya qnx buru ya pxq (ihu 23). 
 
Na Nwata bulie nna ya elu Emuka mechara lqta ma q d[ nk[r[ka ka onye ara d[ka Nne na 
nna ya siri rqq ya na nrq. 
Iloka: Onye ara q bx, 
  Q s[ nga qbx ebe a a na-agwq 



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 7 

  nd[ ara? 
  (O let[px anya kwuo n’olu d[ elu) 
  B[a, 
  onye ahx o yikwara Emuka 
  nwa m? 
Emuka: Nnaa 
  Q bx mx o (ihu 65). 
 
N’Ogbu mmadx ndx na-agx, nrq Mama Obodo mechara b[a na mmezu. Obiqma nwa ya 
hapxrx nwany[ nne ya chqrq ka q lxq bx Amarachi gaa lxq Obiageri bx onye gburu ya site 
n’itinyere ya nsi na nri ya. 
Obiqma: (N’ihe xfx) 
  Eriri afq m 
  na-achq itibi etibi 
  Chaai, q na-afx m xfx ooo 
  Qb[[[, [ nq ebe ahx? 
  (ihu 72) 
Obiageri: (]xrxtx mmanya) 
  D[ka m kwuru 
  na mbx, 
  any[ agagh[ echere 
  ka otu afq gafee 
  tupu any[ ebido 
  lebawara akx na xba 
  nd[ a Obiqma hapxrx 
  laa mmxq anya (ihu 77). 
 
NCH{KQTA 
 
Nchqcha a e mere site n’akwxkwq ejije Igbo nd[ a a hqrqla enyela aka [kqwapxta na nrq 
abxgh[ ihe a na-akpqnye n’imi n’agbanyegh[ na q bxgh[ nrq niile bx ozi. Qtxtx mgbe ka 
nrq na-agba ama ihe ga-eme n’qd[niihu mere o ji d[ mkpa na a ga-eji ya kpqrq ihe iji 
gbochie qdachi nke nrq qjqq nwere ike ibute ma gbaa mbq ka ezi nrq a gbaara ama ya 
pxta ihe n’ihi na mgbe mmadx na-eme ihe site n’ama a gbaara ya, q d[ ka a gwqqrq ya 
qgwx. 
 
Ndxmqdx – Mmadx niile kwes[r[ iji nrq kpqrq ihe 
 
Nd[ odee akwxkwq Igbo ugbu a kwes[r[ itinye uchu n’edemede ha n’ihe gbasara nrq iji 
wee kxziere qgbq ugbu a na nd[ nke ga-ab[a n’ihu ihe ekwe na-akx. 
 
Nd[ okenye kwes[kwara inye aka n’[kxziri xmxaka uru nrq bara n’ihi na o so n’omenaala 
Igbo. Ka nd[ Igbo ghara [bx nd[ nq na mmiri na-asa ahx ncha na-aba ha anya n’ihi na ihe 
mmadx na-amagh[, tqrq ya. A txqrq q mara, ya amara… 

 
 
 
 
 
 
 
 



Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

 8 

NRXMAAKA 
 
Akqma, E. (1977). Obidiya. Ibadan: Oxford University Press. 
 
Baddeley, A. (Ed) (1980). Academic American Encyclopaedia vol. 13 (15th edition). New 

York. 
Castle de van, R. Hall, C. (1966). The Content Analysis of Dreams. New York: Appleton-

Century Crofts. 
Chinagorom, C.L. (2013). Uru Ezi Akanka n’Agxmagx Igbo Ugbu a. Owerri: I.O. 

Publishers. 
Domhoff, W. (2002). The Scientific Study of Dreams. APA: Apa Press 
 
Dornhoff, G.W. (2005). The Dreams of men and women, patterns of Gender, Similarity 

and Difference http://dreamresearch.nt/library/dornhoff-2005c.htm/  
Dreams (Ed) (2000). The American Heritage Dictionary of the English Language, Fourth 

Edition. 
Eziqcha, E.U. (2001). The Facts of Dream. Abuja: Integrated Publishers. 
 
Hornby, A.S. (ed) 1948). Oxford Advanced Learners Dictionary. Oxford: Oxford 

University Press 
Igbokwe, B. (1995). Ogbu Mmadx Ndx Na-Agx. Owerri: Perfectstrokes Publishers. 
 
Kalu, O. & Nwosu, H. (1978). The Study of African Culture in African Cultural 

Development. Enugu: Fourth Dimension Publishers. 
Lawrenson, D. & Swubgwood, A. (1971). The Sociology of Literature. London: Mac 

Gibbon and Kee. 
Moonday, H.I. (1982). Definition of Literature; Literary Appreciation. London: 

Longmans, Green and Co. Ltd. 
Nwadike, I.U. (1992). Nwata Bulie Nna ya elu. Obosi: Pacific Publishers 
 
Ofomata, C.E. (2004). Ndezu Xtqasxsx Igbo nke nd[ Sin[q Sekqnd[r[. Enugu: Format 

Publishers Nig. Ltd. 
Ogbalu, F.C. (2006) Omenala Igbo. Onitsha: University Publishers. 
 
Omego, C. (2007). “A Survey of Language use and Culture in Igboland”. Journal of 

Nigerian Languages and Culture vol. 9. P. 168. 
Osuagwu, B.I.N. (1981). Nd[ Igbo Na Omenaala ha. Owerri: Macmillan Nigeria 

Publishers. 

Okoro L.C (2012 Ederede Igbo. Owerri Trumpeters Concept 
 
The Living Bible (1985). Nairobi: Living Bible International Africa. 
 
The New Encyclopaedia Britannica. Vol 14 (15th edition) Chicago. 
 
Ubesie, T. (1978). Qd[naala Igbo. Ibadan: Oxford University Press. 
 
 
 

http://dreamresearch.nt/library/dornhoff-2005c.htm/

