




































 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

99 

 

XFQDX AKAMGBA CHERE ASXSX IGBO  
 

Akidi, Felista Chichi 
Directorate of General Studies, 

Federal University of Technology, Owerri 
 
Xm[ederede 
 
Asxsx Igbo maa mma jqq njq q d[ara xmxafq Igbo niile. Onye q bxla kwes[r[ 
itinye aka mee asxsx Igbo ka q mawaga mma kar[a etu q d[ ugbu a. Ihe 
kpalitere ederede a bx na odee leruru anya nke qma ma chqpxta na nd[ Igbo 
anwaala oko ha ebe q d[ ukwuu [hx na asxsx Igbo kwxrx ch[m. Ha ka na-
agakwa n’ihu [gba mbq d[ iche iche na ihu na mbq nd[ nke ha gbara efugh[ 
qh[a. N’ihi na e tinye nnu na nri q bxrx na q txgh[ ya a ga na-etinyekwa ka o 
were pxta nke qma, maka na q bxrx na a kwxs[ itinye nke e tinyere etinye furu 
qh[a. Mbq nd[ a a gbarala gxnyere ime ka nne na nna ghqta mkpa q d[ isi n’xlq 
malite [kxziri xmxaka asxsx Igbo, ya bx [zxlite nwata xzq q ga-esi etoo, ka q 
ghara [hapx xzq ahx mgbe o toro (proverb 6:22), [kxzi Igbo bido 
n’xlqakwxkwq kacha ala ruo na nke kacha elu, iji asxsx Igbo ezi oziqma, 
ihiwe otu na qgbakq d[ iche iche e ji akwalite asxsx Igbo dgz. Qtxtx oge ka a 
na-ahxta na mbq nd[ a nwere ihe nd[ na-agba ha xkwx site n’aka nd[ Igbo 
n’onwe ha. N’ihi na mmadx anagh[ amata uru ihe o nwere bara rue mgbe q 
chqrq ya achqq. Akamgba nd[ a chere asxsx Igbo gxnyere: agwa nd[ nne na 
nna, nlel[ anya, e nwegh[ afq ojuju, ihere, nd[ isi ga-enye aka hazie aghazie na-
ekposa ekposa na ihe nd[ qzq. A chqpxtara na asxsx Igbo zuru oke maa xma. 
O nwegh[ ihe asxsx nd[ ama ama n’xwa nwere asxsx Igbo enwegh[. Ya bx 
onye Igbo qbxla kwes[r[ inwe ojuju afq n’ebe asxsx Igbo d[ ma tinye aka 
kwado asxsx Igbo nke qma maka na a gbakqq qnx nyxq maam[r[ q gba xfxfx.  
 
 
Mkpqlite 
 
Ebe onye bi ka q na-awachi n’ihi na mmadx hapx [racha qnx ya, xgxrx 
arachaara ya. Onye anqgh[ n’xlq e buru abq ya. Onye anqgh[ nso ji ya eghe 
otu akxkx maqbx ree qkx. Ya mere nd[ Igbo n’onwe ha kwes[r[ iji aka ha 
kwado asxsx ha nke qma ma ghara [d[ na-agba asxsx ha xkwx. Ihe q bxla bx 
nsogbu asxsx Igbo nwere taa si nd[ Igbo n’onwe ha n’aka. 
 
Asxsx bx oke Chukwu kenyere agbxrx q bxla iji mee ka ndx na-aga nke qma. 
Agbxrx q bxla tufuru nke ha enweela nnukwu nsogbu n’ihi na ha agagh[z[ 
enwe ike aghqta onwe ha. Ndx ha ga-ad[z[ gharaghara. Asxsx Igbo ka Chineke 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

100 

 

nyere nd[ Igbo ka ha were na-eme ihe niile e ji asxsx eme. Iji gosi na asxsx 
Igbo zuru oke, nd[ Igbo oge ochie jiri asxsx Igbo mee omenala niile ha mere, 
ha ejigh[ asxsx qzq, ha jiri ya zxq xmx, rxq qrx, zxq ah[a, kxzie ihe dgz. Ha jiri 
ya kpaa ike d[ iche iche. G[n[ mere any[ agagh[ eso nzq xkwx d[ etu a? Ka any[ 
jisie asxsx any[ ike kwado ya ma na-akwanyere ya ugwu. Ka any[ ghara [bx 
akamgba nyere asxsx Igbo. 
 
Asxsx bx ihe niile nyere mmadx. E wepx asxsx obibi ndx mmadx agagh[ ad[ 
xtq, mgbagwoju anya ga-ejupxta na ndx mmadx. Asxsx Igbo baara nd[ Igbo 
uru n’xd[ q bxla. Onwegh[ ihe asxsx nd[ a ma ama n’xwa ga-eme asxsx Igbo 
na apxgh[ ime belxsq ma nd[ Igbo achqgh[. Nd[ Igbo agbaala qtxtx mbq iji hx 
na Igbo na-aga n’ihu. Ha ehiwela qtxtx otu na-akwalite asxsx na omenala 
Igbo. Ihe niile nd[ a bx ka asxsx Igbo na-aga n’ihu oge niile n’enwegh[ 
mkpqbi xkwx. Mana g[n[ ka a na-ahx n’aka nd[ Igbo n’onwe ha nq n’isi? 
Onye r[fee ogwe ya si ogwe gbajie? Nd[ isi xfqdx ka a na-ar[a. E wepxta 
atxmatx d[ mma maka asxsx Igbo nd[ isi xfqdx q d[ n’aka ime ya ka q pxta ihe 
a chqq xzq pichie ya. Ha agagh[ achq ka mbunuche qma atxmatx ahx pxta ihe. 
Kedx qnqdx xfqdx otu d[ iche iche e wepxtara maka [kwado Igbo nq taa? 
Kedx maka qmxmx asxsx Igbo na General Studies (GST) na Mahadum any[ 
ga taa? Kedx maka [kxziri nd[ abxgh[ nd[ Igbo asxsx Igbo na NYSC 
Orienteshqn Campx nd[ nq n’ala Igbo? Kedx qnqdx akwxkwq akxkq nd[ a na-
ede n’Igbo? Kedx ka any[ si akxziri nd[ abxgh[ nd[ Igbo b[ara n’ala Igbo? 
Any[ na-ahapx asxsx Igbo mxwa nke ha? Q d[ mma ka any[ leruo anya n’ajxjx 
nd[ a ma mee nchqpxta tupu any[ azaa ajxjx nd[ a? Mgbe ahx any[ ga-amata na 
qganihu na qd[da asxsx Igbo d[ any[ n’aka. 
 
Asxsx 
 
Anqzie (1999:11) kqwara asxsx d[ ka xdaolu mmadx a haziri ahazi. N’otu aka 
ahx Okafor na Ewelukwa (2008:1) hxtara asxsx d[ ka xzq nd[ ochie chqpxtara 
ka mmadx na ibe ya wee na-ekwur[ta okwu, na-agwar[ta ibe ha ihe ha chqrq 
ka ha mata. Asxsx bx onyinye Chukwu n’ebe mmadx nq. E wepx asxsx e 
nwegh[ ihe mmadx na-eme nwere isi n’ihi na e nwegh[ onye ga-aghqta ibe ya. 
Ya mere mmadx ji eji asxsx eme ihe niile q na-eme na ndx. 
 
Mba niile nq n’xwa nwere asxsx. N’ihi na Chineke anagh[ ekecha mmadx 
gbaba ya aka. Asxsx bx onyinye Chukwu. Onye q bxla ]xjuru mmiri ara afq 
ekwes[gh[ iji onyinye Chukwu nyere ya gwue egwu. N’ihi na onyinye 
Chukwu a d[ qkpx, o kwes[r[ ichekwa ya n’xzq pxrx iche ma were ya na-eme 
ngala. Ak[d[ (2009:26) kwuru na q d[ mkpa ka any[ mata na asxsx Igbo d[ 
qkpx. Mmadx tufuo asxsx ya, q tufuola njirimara ya. Onye ahx efuola. 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

101 

 

Njirimara mmadx bx asxsx n’ihi na q bx naan[ mmadx nwe asxsx. Njirimara 
ka e ji mata ebe onye si, ihe q na-eme na ihe q pxrx ime. 
 
O kwere nghqta na asxsx malitere mgbe mmadx hxrx onwe ya n’xwa. Asxsx 
ka nd[ gboo jiri bie ndx ha. E nwebegh[ onye nwere ike [s[ lee onye malitere 
[sx asxsx n’xwa. Nd[ mmadx a ma ama chqpxtara qtxtx ihe d[ n’xwa d[ ka: baa 
route to India, xgbqelu, intanet, na ihe nd[ qzq mana a magh[ onye chqpxtara 
maqbx bidoro asxsx. 
 
Qtxtx qrx asxsx na-arx kar[r[ uche mmadx nghqta. E wepx asxsx, obibi ndx 
enwegh[ isi. Asxsx na-eme ka ndx na-atq xtq. Dike (2004:4) hxtara asxsx d[ ka 
ihe e ji egosipxta ume qma mmadx nwere n’ebe ibe ya nq, mmadx na ibe ya 
na-eji asxsx anqr[ta, kpaa nkata na-enyere ndx aka. N’otu aka ahx, Akidi 
(2008:93) si na asxsx ka mmadx ji ezipxta, mbunuche, mmetxta na ihe q 
chqrq. E wepu asxsx, nghqta agagh[ ad[ n’etiti mmadx na ibe ya, agagh[ enwe 
ohere [rxkqta qrx qnx. Ihe nke a pxtara bx na ndx mmadx enwegh[ isi agagh[ 
enwe qganihu. 
 
Obodo enwegh[ asxsx ad[gh[ n’elu xwa. Kama obodo nwere ike ikwe ka asxsx 
ha nwxq. Obodo q bxla asxsx ha nwxrx anwxqla n’ihi na ha enwegh[zi 
njirimara qzq. E nwegh[ ihe a ga-eji cheta ha qzq. Asxsx obodo na-enwe nhazi 
na nghqta d[ka omenala ha siri nabata, n’ihi na qkwa mba na-ach[ n’olu n’olu, 
ebe nkx d[ na mba na-eghere mba nri. Ya ka o ji d[ mkpa na mba q bxla 
kwes[r[ inwe ojuju afq n’ihe ha nwere d[ ka asxsx ma chekwaa ya nke qma 
n’xzq pxrx iche site n’[gx, ide na [sx ya bx asxsx na kwa [kxzi ya bido n’xlq 
akwxkwq d[karichara ala ruo n’xlq akwxkwq kacha d[ elu Ezeuko na Chira 
(2005:1)  
 

kwuru na asxsx q bxla ma e dere ya ede ma e 
kwuru ya n’qnx sitere na nhazi mkpxrxxda na 
ibe ya iji mebe okwu, ya na ndokq mkpxrxokwu 
na mkpxrxasxsx n’usoro d[ mma, ka e were 
mebe ah[r[okwu nwere echiche na nghqta zuru 
oke. 
 

Asxsx niile d[ n’xwa nwere olund[ b[a nwekwaa olu izugbe maqbx asxsx 
izugbe.  Olund[ ka a na-asx n’ime ime obodo ebe asxsx izugbe bx asxsx nd[ 
qch[ch[, nd[ mepere anya na nd[ gxlitere akwxkwq. Any[ ga-amata na q bx 
n’olund[ ka e si enweta asxsx izugbe. Ya bx ma olund[ ma asxsx izugbe d[ 
mkpa n’asxsx qbxla, q bxrx na nke a ad[gh[ nke qzq agagh[ ad[. 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

102 

 

 
Asxsx Igbo 
 
Asxsx Igbo bx asxsx nd[ Igbo nwe. Ya ka ha ji eme omenala, azx ah[a, arx 
qrx, emekqr[ta ma na-eme ihe nd[ qzq d[ iche iche. Asxsx Igbo pxrx iche n’ihi 
e nwegh[ asxsx qzq d[ n’xwa ya na asxsx Igbo nwere otu nd[ njirimara 
kpqmkwem (Akidi 2012:217). N’otu aka ahxkwa, Ugoh (1999/2000:14) mere 
ka o doo ewu na qkxkq anya na asxsx Igbo d[ ka ‘dike’ kwxxrx onwe ya. 
Asxsx Igbo, d[ ka onyinye Chineke nyere nd[ Igbo niile kwes[r[ ka Igbo niile 
na-enye ya nkwado pxrx iche, site n’[mx, [gx, ide na iji ya eme ihe niile 
mmmadx ji asxsx eme n’xwa. 
 
Asxsx Igbo d[ ka asxsx nd[ qzq a ma ama n’xwa nwere olund[ na olu izugbe. 
Asxsx Igbo, ma olund[ ma Igbo izugbe nwere usoro nhazi d[ ka nghqta na 
omenala siri nabata. Iji maa atx n’Igbo izugbe, mgbochiume abxq anagh[ 
anqkq qnx n’otu okwu. Ebe mgbochiume abxq nwere ike [nqkq bx mgbe otu 
na-arx qrx d[ ka myirixdaume na mgbe q bx mgbochiume mkp[, xdaume abxq 
nwere ike [nqkq qnx n’otu okwu kwe mkpqpxta n’ihi na q bx xdaume na-
ewepxta xda n’asxsx Igbo. Q bxrx na mgbochiume abxq na-arx qrx d[ ka 
mgbochiume nqkqq qnx n’otu okwu xda ha agagh[ apxta nke qma. Okwu ahx 
agagh[ ekwe qkpxkpq na nghqta. ([nqkq qnx m na-ekwu bx isote onwe ha 
ozugbo n’otu okwu). 
 
N’asxsx Igbo, olund[ ka e si amata ebe mmadx si kpqmkwem ma q bxrx na 
mmadx were olund[ kwuo okwu, maka na mba q bxla nwere ihe ha jiri biri. Ya 
mere Nebo (1999/2000:4) jiri dee na Igbo na-asx n’olu n’olu, ma ha kwaa 
xkwara q bxrx otu. Demson (2003:92) hxtara olund[ maqbx olumba d[ ka olu 
nd[ ahx nd[ Igbo na-asx na mpaghara ha d[ iche iche. 
 
Asxsx Igbo d[ ka asxsx nwere usoro na nhazi nwere qtqgrafi nke onye q bxla 
na-agbaso were ede Igbo izugbe nke a kpqrq Qtqgraf[ ‘Qnwx 1961’. 
Nwaozuzu (1999/2000:13) kqwara na q bx ka o ruru n’afq 1961 ka gqqmenti 
hiwere otu nke onye dib[a oyibo bx Dqk[ta S.E.Qnwx bx onye [s[ ya. Nhazi 
qtqgrafi a nyere aka ka asxsx na omenala Igbo na-agawaga n’ihu ma taa: 
“Asxsx Igbo d[ ka asxsx nd[ a ma ama n’xwa niile, a haziri ya nke qma iji 
nwee ike ide ma sxqkwa ya n’agbanyegh[ nd[iche na olund[ d[ na ya, Ugoh 
(1999/2000:14). Olund[ d[ mkpa n’asxsx Igbo n’ihi na q bx n’olund[ ka Igbo 
izugbe si pxta Akidi (2008:78). 
 
Asxsx Igbo na-aga n’ihu kwa xbqch[ mana qtxtx ihe na-agba nkwalite asxsx 
Igbo xkwx. Agbamxkwx a na-eweta oke ihe nh[aahx ebe nd[ na-agba mbq 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

103 

 

[kwalite asxsx Igbo nq. Kaosilad[, akamgba chere onye q bxla bx onye Igbo bx 
[hx na asxsx Igbo toro kar[a ka q d[ ugbu a. N’ihi na gidigidi bx ugwu eze, 
igwe bx ike. Ebe otu obi bx qganihu. 
 
Xfqdx Ihe Nd[ Na-adqla Asxsx Igbo Azx gxnyere: 
 

a) Enwegh[ Afq Ojuju n’Ebe Asxsx Igbo D[ 
 

Ejigh[ asxsx Igbo kpqrq ihe etu e siri jiri asxsx Bekee, French[ na asxsx nd[ 
qzq a ma ama kpqrq ihe, so n’otu ihe na-adqla asxsx Igbo azx. Onye Igbo 
nwere ike [gba mbq iso mee ka asxsx nd[ mba qzq gaa n’ihu ma na-atxkwa aro 
ihe a ga-eme ka asxsx Igbo nwxq p[[. Onye Igbo nwere ike [gx asxsx onye qzq 
gxrue ya n’isi. Mana onye Igbo a gxrx asxsx onye qzq ga na-as[ e ji asxsx Igbo 
eme g[n[?, asxsx Igbo biri n’ala Igbo, enwegh[ ebe e ji asxsx Igbo aga. Mana 
d[ka m siri hx ugbu a, nd[ jepxrx eju px na-amata na asxsx qbxla bara uru nye 
nd[ nwe ya na nd[ ha na ha na-emekq ihe. 
 
Onye qbxla bx onye Igbo kwes[r[ [bx onye nkxzi. Q bxgh[ sq ide ihe n’ugbo 
ojii na-eme mmadx onye nkxzi. Onye Igbo qbxla nwere ike inye aka kxziere, 
ma gbaziere nd[ a na-ejigh[ asxsx Igbo kpqrq ihe na-as[ e ji asxsx Igbo eme 
g[n[? Mee ka ha mata na asxsx Igbo bara oke uru; ihe qbxla asxsx Bekee mere 
asxsx Igbo pxrx ime ya. Q bx nd[ Igbo n’onwe ha kwes[r[ [kwalite asxsx Igbo 
ma nwee ojuju afq n’ebe asxsx ha d[. N’ihi ihe mmadx kpqrq ihe ya ka q ga-
aza. D[ka Woode (2012) siri kqwaa, Asxsx Bekee nqrq n’ohu n’ebe asxsx 
French[ nq ihe d[ka (300 years) afq nar[ atq. Mgbe ahx, nd[ na-asx asxsx 
Bekee bx nd[ na enwegh[ ka q d[ ha na nd[ emepegh[ anya. Mana taa, asxsx 
Bekee ka a hxziri d[ ka asxsx nd[ mepere anya, asxsx nd[ qgaranya na asxsx 
xwa niile ji ezi ozi, agx akwxkwq, arx qrx gqqmenti na ihe nd[ qzq. 
 
Nd[ Igbo nwekwara ike [gba xd[ mbq a iji mee ka asxsx Igbo na-ada xda 
n’xwa niile. Q bx nd[ Igbo ga-agbadosi anya na xkwx ike were kwado asxsx 
ha n’ihi ebe onye bi ka q na-awachi. Qzqkwa bx na mmadx ga-ebu xzq si 
lekwa ebe ya nq tupu a hx ya. Onye hapx ji ya n’qkx o ghee otu akxkx ma q 
bx rechaa kpamkpam. Ya bx ka any[ bx nd[ Igbo jisie ike n’qrx. 
 
Any[ na-ahxta mgbe xfqdx n’qgbakq bx naan[ nd[ Igbo nwe ya, mmadx were 
asxsx Igbo tqrq xtq na nt[, e jiri ilu, akpaalaokwu, xkabxilu dgz dabara adaba 
ma nwee ezi nhazi gwa qha okwu a hxta onye ahx d[ ka onye amagh[ 
akwxkwq. Mana mmadx were asxsx Bekee na-aga ya were were n’qnx na-
ekwu okwu, ma q ma asx ma q magh[ asx a na-ahxta onye ahx d[ ka onye 
maara akwxkwq n’etiti nd[ amagh[ ihe. 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

104 

 

 
Any[ kwes[r[ imata na asxsx Igbo agbagoola nke qma kar[a etu q d[bx mbx. 
Ya bx onye q bxla kwes[r[ inwe afqojuju n’asxsx any[ bx asxsx Igbo. Onye 
Igbo q bxla kwes[r[ [ na-elegara asxsx Igbo anya qma n’ihi na asxsx Igbo 
ad[gh[zikwa ka nwa ihe a ga na-elel[ anya. Ume. Ugoji na Dike (2008:ix) 
kwuru na oge agaala mgbe mmadx nwere ike iji naan[ nwa fechafecha ihe q 
maara n’asxsx bekee malite [kqwa xtqasxsx Igbo. Ya bx ka nd[ Igbo nwee afq 
ojuju n’Igbo ma gxq ma mxta Igbo nke qma, ka onye Igbo ghara [s[ ana m 
amx asxsx Igbo e nwere ihe m amagh[ n’Igbo? 
 
(b) Nleda Anya 
 
Mmadx anagh[ ama uru ihe o nwere bara were rue mgbe o fulahxrx ya. Qtxtx 
nd[ Igbo na-eleda asxsx ha anya, n’ihi na ha chere na asxsx Igbo abagh[ uru.  
Ha na-eleda nd[ na-amx, nd[ na-asx, nd[ na-agx na nd[ na-akxzi Igbo anya nke 
ukwu. Qtxtx mgbe ka nd[ d[ etu a na-eleghara onye na-asx Igbo d[ ka onye 
amagh[ ihe, onye amagh[ akwxkwq na onye agxgh[ akwxkwq. Onye gara 
mahadum [gx Igbo ka ha na-ahxta d[ ka onye amagh[ nke a kqrq na onye 
amagh[ ihe ekwe na-akx. Xfqdx na-as[ q kwa onye ahx gxchaa Igbo ya 
akxzibe Igbo. Onye ahx q chqrq [da ogbenye ebigh[ ebi? Ya mere ha na-
elegara onye nkxzi Igbo d[ ka onye aghqtagh[ onwe ya. Xfqdx s[ na onye na-
akxzi Igbo enwegh[ ihe q ma, enwegh[ ihe d[ n’xbxrx isi ya. 
 
Nleda anya so n’ihe na-adqghachi asxsx Igbo azx. Nchqpxta gosiri na ihe 
kar[r[ qkara nd[ niile gxrx Igbo ejigh[ anya qma gxq ya. Xfqdx gxrx ya n’ihi na 
ha amagh[zi ihe ha ga-eme. N’ihi ya ha na-agx ya n’xjq n’ enwegh[ afq ojuju. 
Qtxtx mgbe ka nd[ mmadx na-eji Igbo eme jide chqba. Ha na-agx Igbo ma q 
bx na-akxzi Igbo ka na-eleghar[ anya ihe qzq ha ga-eme. Obi abxq nd[ a ha na-
enwe na-eme ka ha ghara [mxta, [gx na ide asxsx Igbo nke qma. Mana ka any[ 
mata na ihe q bxla mmadx na-eme, o kwes[r[ imezi ya nke qma. 
 
Ka any[ mata na echiche abagh[ uru nd[ mmadx na-eche banyere nd[ na-asx, 
agx, ede na nd[ na-akxzi Igbo abxgh[ eziokwu. E leruo anya nke qma q bx nd[ 
na-eche echiche enwegh[ isi a bx nd[ amagh[ ihe na nd[ amagh[ akwxkwq n’ihi 
na akpqpxta ha b[a dee ma q bx kxzie Igbo ha agagh[ emetali ya nke qma. { 
lebakwuo anya nke qma [ ga-ahx na nke ha na-eme ha anagh[ eme ya nke qma 
q bx ya ka ha jiri nwee efe ha ji agba as[r[. Mana any[ ga-amata na Igbo 
ad[zigh[ etu ahx ha chere. Asxsx Igbo pxrx inyeju mmadx afq, nye ya ezigbo 
qrx, mee ka aha ya daa xda n’xwa any[ nq taa ma onye ahx mee nke qma 
n’asxsx Igbo. 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

105 

 

Ch. Ihere 
 
Nleda anya, a na-eleda Igbo na-eduba xfqdx n’ihere. Ya mere qtxtx nd[ 
mmadx anagh[ enwe mmas[ [gx Igbo n’xloakwxkwq d[ elu n’ihi ihere ihe nd[ 
mmadx ga-ekwu. Nd[ na-agx agx ihere ikwu na ha na-agx Igbo na-eme ha. 
Xfqdx na-agx Igbo na kqleji nke edukeshqn na-agwa nd[ mmadx na ha na-agx 
medisin ma q bx injin[ar[n na kqleji nke edukeshqn. Ha na-ejikwa ihere na-ezo 
akwxkwq Igbo ha ezo. Ihere a na-edunye nd[ mmadx n’obi abxq mgbe xfqdx 
ha hapxzie [gx Igbo ha na-agx bxrxzie nd[ na-agxchagh[ akwxkwq ha (drop 
out). Xfqdx bido leghar[a jambx banye [mx ihe qzq mgbe xfqdx ha nqrq ebe 
ha na-ele jambx oge agaa. Xfqdx nd[ nkxzi Igbo anagh[ ede ihe ngxpxta ha 
(conference paper) n’Igbo n’ihi ihere. Ihere na-eme ka nd[ ntorob[a ghara inwe 
mmas[ n’asxsx Igbo. 
 
d. Nd[ isi 
 
Qtxtx mgbe nd[ hxtara onwe ha n’isi xlq qrx, xlq akwxkwq na otu d[ iche iche 
na-agba mbq d[ egwu [hx na asxsx Igbo nwxrx p[[ maqbx debe ya qnqdx q d[ 
ndx qnwx ka mma. Ha na-eti iwu d[ iche iche [hx na asxsx Igbo anqnyegh[ ebe 
ihe qmxmx nd[ qzq d[. Ha na-ewere asxsx Igbo debe n’akxkx. 
 
N’xfqdx xlqakwxkwq nd[ d[ elu ebe a na-eme Igbo d[ ka “General Studies” 
nd[ isi anagh[ enye Igbo ohere e nyere ihe qmxmx nd[ qzq d[ ka F[lqsqfi, 
Sqsh[qlqj[, Inglishi dgz. Nd[ isi d[ etu a na-agba mbq itinye nd[ na-akxzi Igbo 
n’qnqdx nhxju anya na anya mmiri site n’anagh[ ekwe ka oke ruru nd[ nkxzi a 
rute ha aka. Qtxtx mgbe ka ha na-etiri xmxakwxkwq iwu ka ha ghara ime Igbo 
na “General Studies”. 
 
Xfqdx nd[ isi nwe xlqakwxkwq nke mmadx nwe (private school) anagh[ ekwe 
ka a mxwa ma q bx kxziwe Igbo n’xlqakwxkwq ha. Ha na-eche na [kxzi Igbo 
n’xlqakwxkwq ha ga-eme ka e leda xlqakwxkwq ha anya ma hxta 
xmxakwxkwq na nd[ nkxzi ha d[ ka nd[ na enwegh[ ihe ha ch[. 
 
Mgbe xfqdx e nwee nzukq banyere Igbo nd[ isi na-enye iwu ka e dee ma 
gxpxta ihe n’oyibo ka mmadx niile were ghqta. M were na-ajx s[, iwu d[ otu a 
q na-akwalite asxsx Igbo ka q na-akwada ya? Q bxrx na e nwere nd[ amagh[ 
Igbo n’qgbakq d[ etu a, o kwes[r[ ka e nwee qkqwa (interpreter). 
 
 
 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

106 

 

e. Nd[ Nkxzi 
 
Akamgba nd[ chere asxsx Igbo mere enwegh[ nd[ nkxzi buru ibu na-akxzi 
Igbo. Qtxtx na-akxzi Igbo agxgh[ Igbo, ha amagh[kwa ede Igbo nke qma. 
Mgbe xfqdx ha na-azxpxta nd[ d[ ka ha n’ihi na q bx ihe mmadx nwere ka q 
na-enye. Mmadx anagh[ enye ihe o nwegh[. Onye nkxzi kwes[r[ [kxzite na 
idete Igbo otu o kwes[r[. Anqzie (1999:37) s[ na q bx eziokwu na qtxtx nd[ 
maara ihe ekwe na-akx n’qmxmx asxsx kwenyere na o nwegh[ usoro nkxzi 
asxsx ka ibe ya mma nke otu ahx. Mana ezigbo onye nkxzi Igbo kwes[r[ 
[gbaso usoro dabara ya na xmxakwxkwq ya iji mee ka ha ghqta nke qma ka 
asxsx Igbo na-atq xtq ma na-aga n’ihu. 
 
N’aka nke qzq, onye q bxla bx onye Igbo kwesiri [bx onye nkxzi ga na akxziri 
nd[ mmadx uru asxsx Igbo bara. Nakwa [kxzi na asxsx Igbo d[kwa ka asxsx 
nd[ qzq a ma ama d[ n’xwa. Kama q bx etu any[ siri were asxsx any[ ka nd[ 
qzq ga-esi were ya. Nkxzi abxgh[ so iwere nzu (chalk) dee ihe n’ugbo ojii 
kama mmadx nwere ike iji qnx nk[t[ kxzie ihe ebe q bxla. 
 
f. Ezinaxlq 
 
Agxgx (2006:71) kwuru na ezinaxlq bx ebe mmalite nkxzi na qmxmx nke na-
ad[ n’etiti nd[ nne na nna na xmxaka ha ma q bxkwanx nd[ qzq binyeere ha. 
Nd[ Igbo na-atx ilu s[ na a na esi n’xlq mara mma were pxta ezi. Akwxkwq 
nsq were s[ ka a zxlite nwata n’xzq q ga-esi too, mgbe o toro, q gagh[ ahapx 
xzq ahx (Proverb 22:6). Ya bx, q bxrx na any[ jiri asxsx Igbo malite [zx xmx 
any[, ha ga-ama na asxsx Igbo d[ mkpa ma bakwaa uru pxrx iche. Xmxaka ga-
emecha bxrxkwa nd[ okenye jirikwa otu aka ahx were zxlite xmx nke ha. Nke 
a ga-enye aka ka a ghara [chq ihe q bxla achq n’asxsx Igbo n’qd[nihu. 
 
Na nwata ka a na-esi malite n’ezinaxlq kxziwere nwata ihe qma maqbx ihe 
qjqq d[ ka ezinaxlq ahx siri chqq. Anqzie (2003:121) hxtara na nwatak[r[ q 
bxla na-akpa ajq agwa bx n’ezinaxlq ka na-elebara ya anya. Ya bx nwata a na-
azxtalighi n’ezinaxlq, q ga-ahia ahx [zxta n’ama. Nwaafq Igbo q bxla kwes[r[ 
iji asxsx Igbo malite n’ihi na, ihe nwata hxrx anagh[ apx ya apx n’obi. 
 
Nne na nna kwes[r[ [hxta asxsx Igbo etu ha si ahx asxsx Bekee. Nne na nna 
ekwes[gh[ ichefu na asxsx na omenala na-agakq. Nne na nna kwes[r[ iji asxsx 
Igbo kxziere xmx ha omenala nd[ Igbo d[ mma nke ga-enyere xmxaka aka 
ibizi ndx. Mgbe xfqdx q na-ara ezigbo ahx iji asxsx qzq akxzi omenala Igbo 
n’ihi na xfqdx ihe nd[ d[ na omenala Igbo ad[gh[ na omenala nd[ mba qzq. 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

107 

 

Xmxaka Igbo kwes[r[ ibu xzq mxta asxsx ha tupu asxsx onye qzq. Nke a ga-
enye aka ka asxsx Igbo na-agbado mgbqrqgwx ghara [nwx, gharakwa ime 
xmxaka nd[ qb[a n’ala nna ha. N’agbanyegh[ nke a, asxsx Igbo akwxrxla. 
Asxsx Igbo agagh[ anwx, ma xfqdx nd[ nne na nna site n’aghqtagh[ aghqta, ha 
kxziere xmx ha asxsx Igbo ma ha akxzigh[. Ma n’ikpeazx, ha ga-eti 
‘mmakwara soro ibe’ mgbe ha na-asx ma na-akxziri xmx ha asxsx Igbo. 
 
Ya bx nd[ nne na nna na ejigh[ asxsx kpqrq ihe mara ma ghqta na asxsx Igbo 
enwegh[ ike [nwx maka na asxsx Igbo agbala mgbqrqgwx. Chinagqrqm 
(2009) dere na Nwadike (2008:47-48) kwuru na asxsx Igbo enwegh[ ike [nwx 
n’ihi na a na-asx asxsx Igbo qtxtx ebe, a na-ede Igbo nke qma, na-akxzi ya 
n’xlqakwxkwq d[ iche iche site na nke pekar[chara mpe ruo na nke kacha elu. 
Asxsx e nyere qd[ ndx a enwegh[ ike [nwx. 
 
Mmadx [ma kar[a otu asxsx d[ ezigbo mma n’ihi asxsx niile bara uru. Mana q 
ka mma na mmadx buru xzq mxta asxsx ya tupu q mxwa asxsx nd[ qzq. 
Mmadx nwere ike [mxta asxsx nd[ qzq n’xlqakwxkwq ma q bx jiri aka ya gxta 
ma mxta asxsx nd[ qzq. Na mbx, q bx site n’akxkq ifo ka e si akxziri xmxaka 
[d[ uchu n’qrx, nsqpxrx, irxsi qrx ike, izere ihe qjqq, ime ka ha mata na 
anyaukwu ad[gh[ mma na ihe nd[ qzq site n’ezinaxlq. Mana site n’ejigh[ ihe 
kpqrq ihe d[ nd[ Igbo n’ahx, ha na-ahxtazi ihe nd[ a d[ ka ihe abagh[ uru q 
bxla. Nwadike (2003:24) dere na site n’akxkq ifo, nd[ Igbo na-enwe ike ime 
ka xmxaka mxta ime ihe qma gbaara ihe qjqq qsq. N’otu aka ahx Ogbalu 
(2007:115) s[r[ na a na-ebido na nwata kxziere xmxaka [d[ na-ekele ekele ma e 
nye ha ihe. Asxsx Igbo na-enye nnukwu aka iji zxq xmxaka ka e si enye 
nsqpxrx. Arisaukwu (2002/2003) dere na asxsx Igbo d[ nnukwu mkpa n’ebe 
onye q bxla nq q kacha n’ebe nd[ na-eto eto nq. 
 
g. Ejigh[ Otu Obi Akwalite Asxsx Igbo 
 
Nke a so n’otu nnukwu ihe nh[aahx nye asxsx Igbo. Nd[ na-agba mbq maka 
qganihu asxsx anagh[ enwe otu nkwekqr[ta mgbe xfqdx. E nwegh[ onye na-
ekweta nke ibe ya kwuru. Onye q bxla na-egosi na ya nwekarichara ibe ya 
n’amamihe. E nwere otu ndesa na otu ndekq. Nd[ ndesa ekwenyegh[ n’ihe nd[ 
ndekq na-ekwu, ebe nd[ ndekq ekwenyegh[ n’ihe nd[ ndesa na-ekwu. Nke a 
agagh[ enye aka. Mana q ga-ad[ mma ka e nwee nkwekqr[ta ma were otu 
usoro na-ede asxsx Igbo maka qganihu. 
 
Q bxrx na e leghachi anya azx mgbe e jiri gbawa mbq maka qganihu asxsx na 
omenala Igbo, e hiwela qtxtx otu nke mbunuche ya bx [kwalite asxsx na 
omenala Igbo mana e leruo anya a chqpxta na mbunuche xfqdx kpqmkwem 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

108 

 

abxgh[ [kwado asxsx na omenala Igbo kama q bx ka ha zara aha maqbx ka ha 
fqjuo akpa ha. Kama a ga-enye aka ka a kwado otu nke e hiwere ehiwe ha 
ahapx ya gaa hiwe otu qzq. Nke a na-eme ka nd[ nke e hiwere ehiwe ghara 
[gbado mgbqrqgwx. Qtxtx otu ma nd[ ochie ma nd[ qhxrx anwxqla p[[ n’ihi 
ejigh[ otu obi. 
 
Q d[ mma ka e tinye aka kwado ma kwalite otu nd[ nke e hiwere ehiwe kar[a 
[gba ha xkwx na ibido otu qzq n’ihi anyaukwu na obi qjqq. Ihe nd[ a niile ma 
nd[ qzq a na-enwegh[ ike metx aka bx ihe nd[ na-echere asxsx Igbo akamgba; 
ma n’agbanyegh[ asxsx Igbo na-agbal[ ito. E wepx aka mgba nd[ a, q bxgh[ 
ebe asxsx Igbo nq taa ka q ga-anq. 
 
Alo 
 
N’agbanyegh[ ihe nh[aahx niile d[ n’odide na qgxgx asxsx Igbo any[ ga-
agbalisi ike ime ka asxsx Igbo rute ogo o kwes[r[. N’ihi ihe rara ahx bx 
mmadx na-eme ya. 
 
Ka any[ mata na e nwegh[ asxsx ka ibe ya mma. Ya bx ka any[ na-enwe 
mmas[ [sx, [gx na ide asxsx Igbo bido n’xlqakwxkwq nta ruo na nke kacha ibe 
ya elu. 
 
Ka nd[ nkxzi Igbo jisikwuo ike na-eme ka nd[ mmadx mata na ezigbo uru d[ 
n’asxsx Igbo. Ka ha were na agxlitekwu asxsx Igbo nke qma. 
 
Ka any[ nyere nd[ mba qzq b[ara n’ala Igbo aka [mxta, [sx na ide asxsx Igbo. 
Ka any[ jisie ike kwxs[ [sxrx nd[ mba qzq asxsx abxgh[ asxsx Igbo n’ala Igbo. 
 
Ka any[ were otu obi na-akwalite asxsx Igbo ghara [d[ na-agba onwe any[ 
xkwx. 
Ka nd[ nkxzi hie aka n’anya nke qma were na-akxzi ka e si asx, ede na agx 
Igbo. Ka ha wepx ihere were qrx ha kpqrq ihe ka xmxakwxkwq ha wee nwee 
ezi mmas[ n’[sx, [gx na ide Igbo. N’ihi na ewepx odide asxsx, asxsx ahx ga-
anwx. 
 
Ka nd[ nne na nna bido n’ezinaxlq were asxsx Igbo kpqrq ihe ma were ya na-
azxlite xmxaka ha. N’ihi na asxsx Igbo kacha mma iji kxziere xmxaka Igbo 
omenala. Ka ha mara ihe ala na-asq nsq ghara ime arx. Ka xmxaka ghara iji 
agwq kee nkx kpqq ya eriri. N’ihi na okenye anagh[ anq n’xlq ewu a mxq 
n’qgbx. 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

109 

 

 
Mmechi 
 
Asxsx Igbo bx q natarachi nke onye Igbo q bxla agagh[ agbahapx n’qsq. 
Mmadx anagh[ agbara ihe q hxrx n’ahx ya qsq. Qganiihu na qd[da asxsx Igbo 
d[ any[ bx nd[ Igbo n’aka. Ya bx ka any[ bx nd[ Igbo hqrq ma any[ ga-akwada 
asxsx Igbo ma any[ ga-akwalite ya. As[ mkwuo, aga m as[ na q d[ mma ka 
any[ nye aka etu ike kwere any[ were otu obi na [hxnanya na-ahazi asxsx Igbo. 
Ka asxsx Igbo were na-aga n’ihu werewere. 
 
Isiokwu ederede a bx qganihu na qd[da asxsx Igbo d[ nd[ Igbo n’onwe ha 
n’aka. Nke bx eziokwu bx na mbq niile a na-agba maka qganihu asxsx na 
omenala Igbo bx nd[ Igbo na-agba ya, n’ihi na nke any[ bx nke any[, nke ha bx 
nke ha. Onye hapx imezi ihe o jiri biri nd[ qzq emebie ya. N’aka nke qzq, aka 
mgba niile chere asxsx Igbo bx nd[ Igbo n’onwe ha na-akpata ya ma na-
akwanye qkx. Nsogbu niile a bido n’isi ruo n’qdx bx nd[ Igbo ka o si n’aka. 
 
Ana m as[, ka onye Igbo q bxla leruo onwe ya anya ma jxq onwe ya ajxjx ma 
q na-emezi emezi ka q na-emebi emebi.  Onye na-emezi emezi jisie ike n’ihi 
na onye a s[ jide ka o ji ya mara na nke o ji d[ mma. Onye na-emebi emebi ya 
cheghar[a ma bido meziwe asxsx Igbo maka q d[ mma nd[ Igbo niile. Onye a 
s[ hapx nke o ji ya mara na nke o ji ad[gh[ mma. Ka q d[r[ nd[ Igbo niile mma 
ooo!!! 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

110 

 

Akwxkwq nd[ a rxtxrx aka 
 
Agxgx, M.O. (2006). Nd[ Igbo na Akxkq Ala Ha. Nsukka: Eva-Unique 

Enterprises. 
 
Akidi, F.C. (2008). ‘Language Without Words’ in Journal of Language, Art 

and Cultural Studies. Vol. 1. Owerri: A.I.F.C.E. 
 
Akidi, F.C. (2009). Asxsx D[ ka ihe Igbo Agagh[ Anwx. Opiike Journal of 

Igbo Language and Culture. Vol. 1. No. 1 Department of Nigerian 
Languages, Owerri: A.I.F.C.E. 

 
Akidi, F.C. (2011). Standard Igbo and Osina dialext: Similarities and 

differences A}X Journal of Igbo Arts and Culture. Owerri: Imo 
State Council for Arts and Culture. 

 
Akidi, F.C. (2012). ‘Igbo Language and its Characteristics’ in Qja 

International Journal of Igbo, African and Asian Studies. Awka: 
Unizik 

 
Anqzie, C.C. (1999). Lingwistiki Sayens: Asxsx. Nsukka: Fulladu Publishing 

Company. 
 
Anqzie, C.C. (2003). Igbo Kwenu (Akxkq na Omenala Nd[ Igbo) Enugu: 

Computer Publishers. 
 
Arisaukwu, U. (2002/2003). “Nke m d[[r[ m onye gba nk[t[ nke ya efuo”, 

n’qbaokwu QNQ{ Vol. II, No. 3. Owerri: Seat of Wisdom 
Seminary. 

 
Chinagqrqm, L.C. (2009). “Mfxcha Asxsx Igbo: {txuche Nk[t[ in Opiike 

Journal of Igbo Language and Culture. Vol. 1 No. 1. Department of 
Nigerian Languages. Owerri: A.I.F.C.E. 

 
Demson, C.F. (2003). Igbo Ogbaraqhxrx Maka Nkxzi na Omxmx Asxsx na 

Xtqasxsx Igbo. Aba: E- Dems books. 
 
Ezeomeke, S.O. (2004). Igodo Nghqta Xtqasxsx Igbo. Enugu: Computer Edge 

Publishers. 
 



 

 

 

 

 

Posthumous festschrift in honour of late professor R.O. Ezeuko, edited by Dr. Odinye, Egenti & Orji 

 

111 

 

Ezeuko, R.O. na Chira, A.E. (2005).  Fonetiks na Fonqlqji Igbo. Awka: 
Kristophel Publishers. 

 
Goodnews Bible (2002). Second edition. Great Britain: Bath Press 
 
Nebo, M.J. (1999/2000). “Nke m ji ka (asxsx Igbo) n’qbaokwu QNQ{ Vol. II. 

No. 1. Owerri: Seat of Wisdom Seminary. 
 
Nwadike, I.U. (1992).  Ntqala Agxmagx. Nsukka: Ifxnanya Publishers. 
 
Nwadike, I.U. (2003). Agxmagx Qd[nala Igbo (Igbo Oral Literature). Onitsha: 

African First Publishers Cont. 
 
Nwaozuzu, G.I. (1999/2000). ‘Ntolite nkwudo Asxsx Igbo, n’qbaokwu QNQ{ 

Vol. 2. No.1. Owerri: Seat of Wisdom Seminary. 
 
Okafo, C.U. na Ewelukwa U. (2008). Nhazi Asxsx Igbo Maka Ule Sin[q 

Sekqnd[r[ na Kqleji WASSCE, NECO, GCE na JAMB. Onitsha: 
A.C. Global Publishing Co. (Nig). 

 
Sam-Woode (2012). Illustrated Dictionary. Lagos: Academy Press. 
 
Ume, I.A.O., Ugqji, J.U. na Dike, G.A. (2006). Xm[ Nkqwa Xtqasxsx Igbo. 

Owerri: Ark Publishers. 
  


