Microsoft Word - IGWEBUIKE JOURNAL VOL. 3. NO. 4 IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 82 ỌNỌDỤ EKERECHI N’AGỤMAGỤ EDEREDE IGBO Nkoli Mercy Nnyigide Department of Igbo, African and Asian Studies NnamdiAzikiwe University, Awka Anambra State, Nigeria nm.nnyigide@unizik.edu.ng Ụmị Ederede a na-eleba anya na nzipụta ekerechi n’agụmagụ Igbo. E lee anya na gburugburu mmadụ taa, okwu a kpụ n’ọnụ bụ mmekpaahụ dị iche iche ekerechi na- enye mmadụ dịka: iju, mbize nke na-ebute ụnwụ, ọnwụ mmadụ na nsogbu dị iche iche nye mmadụ. N’agbanyeghị na ndị odee na-ezipụta ekerechi n’agụmagụ Igbo, ọkachasị n’abụ ederede Igbo, nwanchọcha chọpụtara na ndị onyocha agụmagụ Igbo kara nwe mmasị n’inyocha ihe ndị metụtara omenala, ndọrọndọrọ ọchịchị, ekpemekpe, jenda, dgz. Nke a na-egosi na ha enwekebeghị mmasị n’inyocha ekerechi a na-ezipụta n’agụmagụ Igbo. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere ederede a nke na-enyocha ekerechi dị iche e zipụtara n’ọyọkọabụ mbụ e bipụtara n’Igbo a na-akpọ Akpa Uche. Ebumnobi ederede a bụ ịchọpụta ọnọdụ ekerechi n’agụmagụ Igbo nakwa ịnyocha ekerehi dị iche iche e zipụtara n’ọyọkọabụ. A gbasoro usoro atụtụ ekokritisizim n’inyocha ụfọdụ ekerechi e zipụtara n’ọyọkọabụ a. Site na nnyocha e mere, a chọpụtara na ndị odeabụ Igbo na- esite n’abụ zipụta nkamma ekerechi na uru dị iche iche ekerechi baara mmadụ. A na- atụ anya na ederede a ga-enye aka kpọlite mmụọ ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị ọgụụ na ndị ọkammụta Igbo n’ebe ekerechi dị. Abstract This study examines the representation of natural phenomena in Igbo literature. Obviously, the impact of natural disasters like flood and erosion on human environment has been a topical issue among many scholars. These disasters have continued to threaten man in his environment. Despite the representation of some natural phenomena in Igbo literature, especially in Igbo written poetry, the researcher observes that many Igbo literary critic prefer to examine other issues represented in Igbo literature like issues that border on culture, politics, religion, governance, gender, etc. It shows that they have little or no interest in some ecological issues depicted in Igbo literature. It is against this backdrop that this study examines some natural phenomena represented in the first Igbo anthology titled Akpa Uche. The paper x-rays and analyses some natural phenomena prominent in this anthology. It adopts the literary theory of ecocriticism in analyzing the selected poems. The study reveals that natural phenomena and ecological issues are well represented in Igbo literature especially in Igbo written poetry. Therefore, the study stresses the need to raise human consciousness, particularly that of Igbo scholars and students on the importance of appreciating, preserving and sustaining the ecosystem through Igbo literature. IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 83 NDUBANYE Mmmekpaahụ ekerechi na-enye mmadụ na gburugburu ya bụzi okwu a kpụ n’ọnụ n’ebe dị iche taa. Mmmekpaahụ na-abịa n’ụdị iju, mbize nke na-ewetara mmadụ nsogbu dị iche iche. Ọ bụ ihe doro anya na ndị odee agụmagụ Igbo na- agbado ukwu n’isiokwu dị iche iche edepụta akwụkwọ ha. Ụfọdụ na-ezipụta ihe na-eme n’ọhaobodo, omenala, usoro ọchịchị, ọnọdụ akụnaụba, ekpemekpe, nchekwa na ekerechi dị iche iche. Ndị onyocha agụmagụ n’akụkụ nke ha na- enyochakwa ka ha si zipụta ihe ndị a n’ọrụ agụmagụ ha. Mana nwanchọcha chọpụtara na ndị onyocha agụmagụ kara nwe mmasị n’inyocha isiokwu dị iche iche a na-ezipụta n’agụmagụ Igbo karịa n’ekerechi. Ọ dịzi ka a ga-asị na ha enweghị mmasị n’ekerechi dị iche iche a na-ezipụta n’agụmagụ Igbo, ọkachasị na ngalaba abụ Igbo. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere ederede a. Ederede a gbadoro ụkwụ na ngalaba abụ ederede Igbo. Nwanchọcha chọpụtara na abụ na-ezipụta nkamma ekerechi. Ọ bụ nke a mere ụfọdụ ndị ọkammụta n’agụmagụ ji asị na abụ bụ nkamma. Akporobaro (2008) kwenyere na nke a Ọ sị na igodo ọzọ e si abanye na ndịna abụ bụ site na nkamma. Ihe mere abụ ji dị iche na ngalaba agụmagụ ndị ọzọ- iduuazị na ejije bụ na ọ na-eji nkaokwu na nkaasụsụ pụrụ iche arụ ọrụ. Asụsụ abụ na-adị omimi. Abụ na- enyekwa ndị odeabụ ohere izipụta ikenkeedideabụ na nhọokwu abụ ha n’ụzọ dị ọgọ. N’ederede a, e nyochara ụfọdụ ekerechi e zipụtara n’Akpa Uche. Nwanchọcha chọpụtara na ụfọdụ ndị odeabụ nyochara abụ ha sitere n’ọrụ ekereuche ha wee too, ekerechi, zipụtakwa nkamma ekerechi na uru dị iche ekerechi baara mmadụ. E bu n’uche na ederede a ga-enye aka kpalite mmetụta ndị ọgụụ na ndị onyocha n’ebe ekerechi dị iche iche e zipụtara n’agụmagụ Igbo dị. Mpụtara Ekerechi N’ebe a, a ga-eleba anya na mpụtara ekerechi. Dị ka e si chọpụta, ekerechi bụ ihe dị iche iche Chukwu okike kere. Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe a na-ahụ anya. Ụfọdụ bụkwa ihe ndị a naghị ahụ anya. Ụfọdụ bụ ihe ndị nwere ndụ, na-ekume ebe ụfọdụ bụ ihe ndị enweghị ndụ, anaghị eku ume. Ha gụnyere: anụmanụ, ahụhụ, osisi, mmiri ozizo, ala, ụgụrụ, ugwu, anyanwụ, ọnwa, egbe eligwe, ezu, ikuku, egwurugwu, dgz. N’usoro okike ụwa, dị ka e si zipụta ya n’akwụkwọ nsọ, a chọpụtara na e bu ụzọ kepụta ekerechi ndị a tupu e kee mmadụ. N’echiche nke ya, Akụnne (2011) kọwara na ekerechi bụ ihe okike dị iche iche Chineke kere n’elu ụwa. Ọ gụnyere mmadụ, anụmanụ, osisi na ihe ndị ọzọ. Mana o mere ka a mata na Chineke kere mmadụ n’oyiyi ya. N’ihi nke a, o nyere mmadụ ọkwa dị elu karịa ekerechi ndị ọzọ ma tinyezie ekerechi ndị a dịka: osisi, mmiri, igwurube, anụmanụ, ahụhụ dị iche iche, dgz. n’okpuru IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 84 mmadụ. Ebumnobi Ya bụ ka mmadụ na-elekọta ha anya, ka ihe ndị a e kere eke n’akụkụ nke ha bakwaara mmadụ uru. N’ịga n’ihu, a chọpụtara na e kesịala ekerechi dị iche iche tupu e kee mmadụ . Nke a na-egosi na ekerechi ndị a adịla n’ụwa tupu e kee mmadụ. Mana ka e kesịrị mmadụ, Chukwu okike tinyere ihe ekerechi niile n’aka mmadụ ka ọ na- elekọta ha anya. Nke a pụtara na Chukwu okike nyere mmadụ ikike na ogo dị elu karịa ekerechi ndị ọzọ n’abụghị mmadụ. A chọpụtarakwara na ebumnobi pụtakarịsịrị ihe e ji kee ihe ndị a bụ ka ha na-arụrụ mmadụ ọrụ pụrụ iche, na- enyere mmadụ aka ma na-egbokwara mmadụ mkpa n’ụzọ abụla ụzọ. Ụfọdụ bụ ndị e kere ka mmadụ site na ha na-enweta ihe oriri dị ka osisi, anụmanụ, akwụkwọ nri, ụfọdụ ka e kere ka ha na-agwọ mmadụ ọrịa dị ka ahịhịa, osisi, dgz. Akunne, Ewuim, Ngenegbo, Ononye na Abajue (2014) chọpụtara na ndụ mmadụ na-adị n’elu ụwa dabeere na mmekọrịta dị n’etiti ya na ekerechi ndị a. Ụfọdụ ndị odeabụ Igbo chọpụtara na ekerechi ndị a nwere ezi ọnọdụ na ndụ ọtụtụ ndị mmadụ. Ọ bụ nke a mere na ọtụtụ n’ime ha na-agbado ụkwụ n’ekerechi dị iche iche wee na-edepụta abụ ha. Ụfọdụ ndị odeabụ a sitere n’abụ ha too ekerechi ndị a, ụfọdụ zipụtara ọrụ pụrụ iche ha na-arụ nakwa nnukwu uru ha baara mmadụ. Ọ bụ ọnọdụ a ekerechi nwere na ndụ ọtụtụ ndị odeabụ mere na a bịa n’agụmagụ ederede Igbo ta a, ọkachasị n’abụ ederede, e nwere ụdị abụ ederede a na-akpọ abụ ekerechi maọbụ abụ ekere. Na nkenụụdị abụ a, a na-ezipụtakarị ekerechi na ya. Ya bụ na dị ka aha ya si dị, ọ bụ ekerechi bụ ihe gbasara ekerechi ka ana-akọwapụta na ya, ma bụrụkwa isi sekpụ ntị na ya. Ụfọdụ ndị ọkammụta n’agụmagụ Igbo nyere nkọwa dị iche gbasara abụ ekerechi. Nwadike (1992:56) kọwara ya dị ka, “Ụdị abụ na-enwe ntụle uche n’ebe ihe e kere eke dị iji gosi mmasị, mgbagwojuanya, ụjọ maọbụ mkpọrọmaasị”. Ekwealor (2009:27) kwenyere n’echiche Nwadike a n’ihi na nkọwa ya gbasara abụ ekerechi. Ọ sị, “Ụdị abụ a na-atụgharị uche n’ihe dị iche iche Chineke kere dị ka anyanwụ, mmiri, ọnwa, kpakpando, ugwu, osisi, dgz. Mgbe ụfọdụ odeabụ na-eto ihe ekere ndị a, mgbe ụfọdụ kwa ọ na-egosipụta etu ha siri bụrụ ihe mgbagwojuanya”. Nkọwa ndị ọkammụta a dabachara nke ọma n’ihi na a chọpụtara na ọtụtụ ndị odeabụ abụ na-ezipụta ekerechi dị iche iche n’abụ ha. A chọpụtakwara na Chukwu okike ji ụfọdụ ekerechi ndị a eje ozi pụrụ iche. Nke a bụ eziokwu n’ihi na ụfọdụ ndị odeabụ Igbo kwenyere na Chukwu okike ji ụfọdụ ekerechi ndị a arụ ọrụ pụrụ iche. Okedịadị (2003), hụtara ekerechi a bụ mmiri ozizo ka ihe na-ejere Chineke ozi. N’ịkwado Okedịadị, Nwadike (2004), kọwakwara na ekerechi a a na-akpọ egbe eligwe na-ejere Chineke ozi pụrụ iche. Site n’echiche ndị a, a ga-achọpụta na Chukwu okike ji ekerechi ndị a eje ozi ụrụ iche. N’ezie, ọ bụrụ na mmadụ chemie echiche ime gbasara ekerechi ndị a, ọ ga-achọpụta na e kere ha ka ha na-arụrụ mmadụ ọrụ pụrụ iche iche, ma IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 85 na-egbokwara ya nnukwu mkpa. Ọ ga-achọpụtakwa na uru ha baara mmadụ karịrị uche mmadụ nghọta. N’aka nke ọzọ, a chọpụtara na ọtụtụ ndị ọkammụta na ngalaba agbata mmadụ na-eme nchọcha ma na-edepụtakwa ederede dị iche iche gbasara mmekọrịta ekerechi, mmadụ na gburugburu ya. Ha arụtụla aka n’ọrụ pụrụ iche ha na- arụrụ mmadụ, uru dị iche iche ha baara mmadụ, mmekpaahụ mmadụ na-enye ha, nsogbu ekere ụwa dị iche iche nakwa ụzọ dị iche iche a ga-esi gbochie nsogbu ndị a. Na mpaghara a, a ga-atụlegharị ụfọdụ ihe ha rụtụrụla aka. Akunne (2011) lebara anya n’ọnọdụ na uru dị iche iche ahụhụ a na-akpọ aṅụ baara mmadụ. Ọ chọpụtara na aṅụ baara mmadụ nnukwu uru. Ha na-enye aka eme ka ifuru osisi mịa mkpụrụ. Ọ kọwara na etu ha si eme nke a bụ ha ha na eburu ntụ ifuru osisi nwoke buga ya na ntụ ifuru osisi nwaanyị. Site na mmekọ dị etu a, ka osisi si amị mkpụrụ ya. Ọ chọpụtakwara na a na-esite n’aṅụ enweta mmanụ aṅụ nke so n’otu ihe kachasị enye mmadụ ego n’oge ugbu a. Ọ kọwara na ọtụtụ mmadụ na-aṅụkwa mmanụ aṅụ n’ihi na ọ na-edozi ahụ na ụbụrụ mmadụ. Nke a na-enyere mmadụ aka iji ụbụrụ ya na ọgụgụ isi ya wee na-echepụta ezigbo echiche. Ọ chọpụtakwara na mfụ aṅụ na-agbanye mmadụ n’ahụ na-agwọ ọrịa dị iche iche n’ahụ mmadụ. Ụfọdụ ndị ọkammụta achọpụtala uru dị iche iche osisi dị iche iche dị ka nkwụ, onugbu, mọrịnga, dgz baara mmadụ. Odibo (2014) chọpụtara na a na-esite na mmanya nkwụ enweta ihe a na-akpọ yiisti, nke e ji emepụta ihe oriri dị iche iche dị ka achịcha, mmanya, dgz. Osazue (2014) chọpụtakwara na akwụkwọ onugbu na-agwọ ọrịa dị iche iche. N’ịkwado Osazue, Igbokwe (2014) chọpụtara na e ji akwụkwọ ụtazị, onugbu, nchụ anwụ, dgz agwọ ọrịa dị iche iche dịka ọrịa afọ. N’otu aka ahụ, ụfọdụ ndị ọkammụta na ngalaba ọmụmụ gburugburu mmadụ achọpụtala ụzọ dị iche ekerechi na mmadụ si emekpa onwe ha anya. Anike (2014) chọpụtara na iju na mbize na-emekpa ọtụtụ obodo ahụ na Steeti Anambra, ọkachasị obodo Nanka. Ọ kọwara na mbize wakporo obodo a n’ọnwa Ọktoba afọ 2012 mebiri ọtụtụ ala, akụkụ ubi na ihe ndị ọzọ e kere eke. Afọka (2014) kwadokwara ya n’ihi na ọ kọwara na mbize bụ ihe na- emekpa ndị bi na mpaghara Oko na Nanka ahụ nke ukwu. Atụtụ Kegburugburu maọbụ Ekokritisizim Dika e kwuru na mbụ, a gbadoro ụkwụ n’atụtụ nnyocha agụmagụ kegburugburu, nke a na-akpọ ekokritisizim na Bekee wee nyochaa abụ ekerechi ederede Igbo a họọrọ. Atụtụ a metụtara ihe ọmụmụ dị iche iche. Aha ọzọ e ji mara atụtụ a bụ “Ecopoetics”. Ọtụtụ ndị ọkammụta agụmagụ enyela nkọwa gbasara atụtụ a n’ụzọ dị iche iche. Glotfelty (1996) kọwara atụtụ kegburugburu dịka ọmụmụ mmekọrịta dị n’etiti agụmagụ na gburugburu mmadụ. Na nkọwa ya, o mere ka a mata na ihe ọmụmụ a gụnyere ntụle nke IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 86 na-agbanwe nghọta ọgụụ n’ebe gburugburu ya dị nakwa oke na ọrụ dịịrị ya n’ibelata mmekpaahụ ọ na-ewetara ya. Ọ kọwakwara na ịgbaso atụtụ a wee nyocha agụmagụ pụtara ịjụ ọtụtụ ajụjụ gbasara ka e si zipụta ekerechi n’akwụkwọ agụmagụ nakwa ọrụ ihe ekerechi ndị ahụ rụrụ na ya. A chọpụtara atụtụ a n’agbata afọ 1960 na 1970. Mana ọ malitere gaba n’ihu n’afọ 1990. Ya bụ, a na-akọwa na ọ bụ n’afọ 1990 ka ọtụtụ ndị ntule agụmagụ malitere nwebe mmasị na ya. Ndị bụ isi a hụrụ kwaba okpu n’atụtụ a dịka Dobie ( 2012) si chọpụta bụ Cheryll Glotfelty na Lawrence Buell. Ndị na- akwado ha dịka Tošić (2006) si kọwa gụnyere: Simon Estok, Harold Fromm, William Howarth, William Ruekert, Suellen Campbell, Michael P., Branch, Green Love, dgz. Ọ kọwakwara na ndị ntule atụtụ ekokritisizim na mba Amerịka nwere otu jikọtara ha ọnụ a na-akpọ - “Association for the Study of Literature and Environment”. Ndị otu a na-ebipụtakwa akwụkwọ jọnal a na- akpọ - Interdisciplinary Studies in Literature and Environment. N’akụkụ nke ya, Bergthaller (2014) kọwara na atụtụ ekokritisizim bụ atụtụ nnyocha agụmagụ dịkarịchara ọhụụ a na-agbadozi ụkwụ na ya were enyocha agụmagụ n’oge ugbu a. O kwenyekwara na ọ bụ n’afọ 1990 ka ọ malitere nwebe ezi ọnọdụ dịka otu n’ime atụtụ nyocha agụmụgụ e ji enyocha agụmagụ na mba USA na UK. Na mpaghara a, a ga-elebazi anya na nkọwa dị iche iche ụfọdụ ndị ọkammụta nyerela gbasara atụtụ a. Philips (1999) kọwara ekokritisizim dịka atụtụ nnyocha agụmagụ ọgbara ọhụụ, nke nwekarịchara mmasị n’ekerechi kacha pụta ihe n’agụmagụ. Na nkọwa nke ya Gerrard (2004) kọwara na ụfọdụ ndị ntule agụmagụ n’usoro atụtụ kegburugburu achọpụtala na ọdachi na nsogbu ekere ụwa anaghị emetụta naanị ihe gbasara teknụụzụ, nchọcha, ndọrọndọrọ ọchịchị, kama ọ na-emetụtakwa omenala. Nke a bụ eziokwu n’ihi na ọ na-abụ e nwee ọdachi nke ekerechi, dịka iju gbaa, ọ na-eweta oke mbibi, ọkachasị ọnwụ mmadụ nakwa nke ụfọdụ ekerechi na-eku ume. Gerrard chọpụtakwara na ọ bụ na ngalaba abụ ka ndị ntule atụtụ a na-agbadokarị ụkwụ wee na-enye ụsa gbasara ụfọdụ ajụjụ na ọnọdụ ekerechi. N’ederede Dobie (2012), isi a hụrụ kwaba okpu n’atụtụ a bụ Cheryll Glotfelty kọwara na atụtụ a na-eleba anya n’ọmụmụ mmekọrịta dị n’etiti agụmụgụ, ekerechi na gburugburu mmadụ. Dịka Dobie si kwu, otu ọkammụta n’agụmagụ Bekee a na-akpọ Estok kọwamiri atụtụ a ka ọ pụta ọmụmụ atụtụ ọbụla dị uchu n’iweta mgbanwe site n’ịtụcha ọrụ ekerechi e zipụtara n’akwụkwọ agụmagụ. Dobie gara n’ihu kọwaa na ihe pụtarịchara ihe n’echiche ọtụtụ ndị ọkammụta gbasara atụtụ a bụ na ha nwechara mmasị n’itule mmekọrịta dị n’etiti agụmagụ na ekerechi. Ọ kọwara na nke a dịka ụzọ e nwere ike isi kpọghachite akọnauche ndị ọgụụ n’ebe ekerechi dị ma mekwa ka ha mara oke na ọrụ dịịrị ha n’ilekọta ekerechi. IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 87 Dobie (2012) kwadoro echiche Gerrard a n’ihi na ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị odeabụ n’ala Bekee na-agbasi mbọ ike n’ibelata ụfọdụ nsogbu na ọdachi ekerechi site n’abụ ha. Dịka Dobie si chọpụta, mmetọ mmanụ ala dapụtara na mba Mexico n’afọ 2010 mere ka e guzobe otu a kpọrọ - “Association of Poets for Living Waters”. Ebumnobi otu a dịka o si kọwa bụ ka e leba anya na mmetọ mmanụ ala a dapụtara na mba Mexico nakwa nsogbu o wetara na gburugburu mmadụ na ụfọdụ ekerechi. Ọ kọwara na ndị otu a hụtara abụ dịka ihe ga-enye ezigbo ụsa gbasara mmetọ mmanụ ala ahụ. Nnyocha ụfọdụ Ekerechi e zipụtara n’Akpa Uche A chọpụtara na ọtụtụ ndị odeabụ Igbo gbadoro ụkwụ n’ekerechi dị iche iche wee depụta abụ ha n’akwụkwọ abụ a. Mana a họọrọ ndị kara daba n’ebumnuuche ederede a. N’abụ ya ọ kpọrọ Egwùrùgwù, Amasike zipụtara otu ekerechi a na-akpọ Egwurugwu. N’abụ a, odeabụ webatara atụmatụokwu a na-akpọ nkwusara n’ito na n’izipụta nkamma ekerechi a. N’abụ a, odeabụ na-agwa egwurugwu okwu ka ọ bụ mmadụ. Odeabụ a ji nkeji abụ anọ zipụta abụ a. Na nkeji nke mbụ, odeabụ a mere ka ọgụụ mata na mpụta egwurugwu na-apụta n’ihu igwe na-enye ya obi aṅụrị. O mekwara ka a mata na mgbe egwurugwu ji apụta n’igwe bụ mgbe anyanwụ labachara n’igwe. Mgbe ahụ ọ na-apụtakarị n’ugwu ya niile. Ọ sị, Egwurugwu, Obi ọma dị m mgbe m hụrụ gị N’oge anyanwụ na-ala n’igwe, Ị pụta n’ugwu gị niile, Egwurugwu. Site n’ahịrị nke abụọ, “Obi ọma dị m mgbe m hụrụ gị”, a ga-achọpụta na ekerechi a nwere ikike ịkpa mmadụ obi ọma. Ọ na-egosikwa na ekerechi a anaghị ewetara mmadụ ihe egwu ọbụla. Na nkeji abụ nke abụọ, odeabụ abụ a gbadoro ụkwụ na mbụrụ wee kọwaa ụdịdị ekerechi a. Ọ kọwara na ọ na-ejikarị ụcha ọla edo wee na-apụta. Ọ na-agakwa igwe gburugburu mgbe ọbụla ọ pụtara. Nke a na-eme ka ihe ndị ọzọ e kere eke na-ekiri ya. Lee ihe o kwuru: Mgbe m na-ele gị anya, Enweghị m ike ịkọwa ọla edo ole i ji wee pụta, Mgbe ahụ ị gara igwe gburugburu, Ụmụ ihe Chi kere eke na-ele gị. Site na nkeji abụ a, a ga-achọpụta mmewere na ọdịdị ekerechi a dịka ụcha ya na ọnọdụ ya n’igwe. Odeabụ a zipụtakwara mmekọrịta dị n’etiti ekerechi a na mmadụ n’ahịrị nke asatọ. Ọ sị, “Ụmụ ihe chi kere na-elele gị”. Nke a na-egosị na ọtụtụ mmadụ na ihe ndị ọzọ e kere eke nwere nnukwu mmasị n’ebe IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 88 ekerechi a dị. Ọ bụ ya mere ha na-eji ekirikarị ya mgbe ọbụla ọ pụtara n’igwe. E leghị anya, ọ na-enye ha ọṅụ. Site n’akụkọ nne odeabụ a kọọrọ ya na nkeji nke atọ gbasara ekerechi a, a ga- achọpụta na mmiri anaghị ezo mgbe ọbụla ekerechi a pụtara n’igwe. Ọ sị, Nne m kọrọla m sị, Ọ bụrụ na egwurugwu pụta n’igwe, mmiri agaghị ezo Beelụsọ mgbe egwurugwu chịrịla Ọcha ya niile, chịbaa ha n’ime igwe. Site n’ahịrị nke iri na otu na nke iri na abụọ , a ga-achọpụtakwa na egwurugwu na-acha ụcha dị iche iche. Ọ sị, Beelụsọ mgbe egwurugwu chịrịla ọcha ya niile, chịbaa ha n’ime igwe. Na nkeji abụ nke anọ, odeabụ a gbadoro ụkwụ n’ajụjụ nzaraonwe wee zipụta nkamma ihe ekerechi a. Ọ kọwapụtara na ekerechi a mara mma dị egwu. O ji mma egwurugwu wee na-atụnyere mma onye kere ya. O mere ka a mata na ekerechi a mara mma dị oke ọnụ, nke apụghị ịzụta n’ahịa. Odeabụ jikwa abụ a wee kelee Chineke, onye kere egwurugwu. Ọ sị; Egwurugwu, Mma niile a, ị mara; Olee k’mma onye kere gị dị? Ị mara mma dị oke ọnụ nke na-agaghị azụta n’ahịa Otito dịrị Chineke, onye kere gị. N’ezie, site na nkeji abụ a, a ga-achọpụta na ụdị mma ekerechi a mara gbagwojuru odeabụ a anya. Ọ bụ nke a mere o ji webata ajụjụ nzaraonwe, egbeokwu ma kwunkwukwa n’izipụta mgbagwoju anya o nwere gbasara ụdị mma egwurugwu mara. O kwugharịrị “mma” ugboro ugboro iji gosipụta n’ezie na ekerechi a mara mma dị egwu. Ọ gbadokwara ụkwụ na mma ekerechi a wee too Chineke onye kere egwurugwu. Nkamma ihe ekerechi a bụ ihe gbakarịchara elu n’abụ a. Site na nkeji abụ a, a ga-achọpụtakwa na ụfọdụ ekerechi na-ezipụta nkamma na ọdịdị Chineke kere ha. Ọ dịkwa mkpa ikwu na nkaasụsụ dị iche iche odeabụ a webatara n’abụ a nyekwara aka n’ụzọ pụrụ iche wee kwalite mmetụtaobi dị n’abụ a. Ọ bụrụ na a gbaso atụtụ kegburugburu wee nyochaa abụ a, a ga-achọpụta na e sitere n’abụ a wee zipụta nkamma ekerechi a a na-akpọ egwurugwu. N’abụ a, e zipụtara mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ekerechi a. Nkeji nke mbụ na nke abụọ zipụtara ọnọdụ mmadụ mgbe ọbụla ekerechi a pụtara n’igwe. O mere ka a mata na egwurugwu na-eme mmadụ obi ọma oge ọbụla o ji ugwu niile na ọcha niile wee pụta n’igwe. Ọdịdị ekerechi a na-emekwa ka mmadụ na ihe ndị IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 89 ọzọ e kere ekere na-ekiri ya. Na nkeji nke atọ, e zipụtara nnukwu ọrụ na uru ekerechi a baara mmadụ. Odeabụ a mere ka a mata na mgbe ọbụla egwurugwu pụtara n’igwe, na mmiri anaghị ezo. Nke a na-egosi na ekerechi a na-enyere mmadụ aka ịhazi ọrụ na ozi ụbọchị ya. Nke a bụ eziokwu n’ihi na ọtụtụ mmadụ na-aka enwe mmasị n’ije ozi na n’ịrụ ọrụ ụbọchị ha nke ọma ma ọ bụrụ na mmiri ezoghị. Mana mmiri ozuzo na-egbochikarị mmadụ ije ozi dịịrị ya n’ụbọchị . Nkeji niile nke abụ a rụtụchara aka na mmekọrịta dị n’etiti mmadụ, ekerechi a na ihe ndị ọzọ e kere eke. Ọ kpọlitere mmasị ọgụụ n’ebe ekerechi a dị. Abụ a ga-abakwara ụfọdụ ndị na-atụcha maka ihu igwe nnukwu uru. Site n’izipụta nkamma ekerechi a na nkeji nke anọ, a chọpụtara na nkamma ya bụ ihe gbakarịchara elu n’abụ a. N’ihi nke a, odeabụ sitere n’abụ a wee na-ewulite mmasị, nghọta na akọnauche ndị ọgụụ na ọhanaeze banyere ekerechi a ma na- echetakwara mmadụ oke na ọrụ dịịrị ha n’ichekwa na n’ịkwagide ekerechi a. Abụ ekerechi nke abụọ e sitere n’Akpa Uche wee họọrọ bụ abụ Iroha, ọ kpọrọ Ọnụ Ụduma- Mmiri Ọma. N’abụ a, odeabụ kọwara maka otu mmiri ndị Ọhafịa a na-akpọ Ọnụ Ụduma. N’abụ a, odeabụ a webatakwara nkwusara n’ito na n’izipụta nkamma ekerechi a. Ọ na-agwa ekerechi a okwu ka a ga-asị na ọ bụ mmadụ. Na nkeji abụ nke mbụ, ọ kọwara na mmiri a bụ mmiri ọma, nke na- adịkarị jụụ ma na-achakwa ọcha. O mere ka a mata na ndị Ọhafịa hụrụ mmiri a na-anya nke ukwuu karịa mmiri ndị mba ọzọ. Ọ sị, Ọnụ Uduma, mmiri ọma anyị; Mmiri dị jụụ na-acha ọcha Ị na-eme n’anyị na-afụ gị n’anya Karịchaa mmiri dị na mba ọzọ. Na nkeji abụ nke abụọ, odeabụ zipụtara nnukwu ọrụ na uru mmiri a baara ndị Ọhafịa. Ha na-enweta mmiri ọṅụṅụ na ihe oriri site na mmiri a. Odeabụ a mere ka a mata na mmiri a na-eme ka ihe ndị obodo a kọrọ n’ugbo na-eto ọsọọsọ. Nke a mere na ihe niile dị n’ala obodo a na-eto mmiri a. Ọ sị; Akpịrị anaghị akpọ anyị nkụ; Site na gị ka ihe oriri si abịa; Akụkụ anyị na-eto ọsịịsọ; Ihe niile dị n’ala anyị na-eto aha gị. Site na nkeji abụ a, a ga-achọpụta na e nwere ezi mmekọrịta n’etiti mmadụ, ekerechi a na ihe ndị ọzọ e kere eke. Mmadụ na akụkụ ubi na-eme nke ọma n’ihi mmiri a. Odeabụ ji nkeji abụ nke atọ wee na-enye mmiri a ekele pụrụ iche. Ọ bụ na nkeji a ka o mere ka ọgụụ mata na mmiri a bụ mmiri ndị Ọhafịa. O mekwara ka a IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 90 mata na mmiri a na-ekwo mgbe niile. Nke a na-egosi na mmiri a ọ na-akọwa maka ya n’abụ a anaghị ata ata. Nke a mere na ndị obodo a na-achụrụ mmiri a aja. Ọ sị; Ọnụ Uduma, nara ekele anyị; Mmiri Ọhafịa, mba ndị ikom; Ị na-ekwo mgbe dum, mmiri ọma; Anyị ji àjà asọpụrụ aha gị. Na nkeji abụ nke anọ, odeabụ a sị: E nye m miri ọzọ, m ga-ajụ ya ajụ Nye m nke a mara aha ya Bụ Uduma ukwu nke mba dị ike Aga m e were ya mee ihe m chọrọ. Odeabụ a sitere na nkeji abụ a wee na-akọwa na mmiri Uduma a ka egboro ya mkpa mmiri karịa mmiri ndị mba ọzọ. Ọ na-akọwa na mmiri a kara bara ya uru karịa mmiri ndị mba ọzọ. Nke a na-egosi na ọ bụ mmiri a mara aha ya, nke mba dị ike. Odeabụ mekwara ka a mata na ọ na-eji mmiri a eme ihe dị iche iche. A chọpụtakwara na nhazi na nhọokwu odeabụ a webatara n’abụ a nyere aka wee zipụta echiche na mmetụtaobi dị n’abụ a. Ọ bụrụ na a gbaso atụtụ kegburugburu wee lebaa anya n’abụ a, a ga-achọpụta na ekerechi odeabụ a zipụtara n’abụ a bụ mmiri. Odeabụ a sitere n’abụ a wee too ma zipụta nkamma ekerechi a. O zipụtara ọrụ na uru ihe ekerechi a baara mmadụ. O mekwara ka a mata na e nwere ezi mmekọrịta n’etiti ekerechi a, mmadụ na ihe ndị ọzọ e kere eke dị ka akụkụ ubi. Ekerechi a na-eme ka akpịrị ghara ịkpọ mmadụ nkụ. Mmadụ na-enweta ihe oriri site na ya. Ọ na-eme ka ihe a kọrọ n’ugbo na-eto ọsọọsọ, dgz. Site n’uru ndị a ekerechi a baara mmadụ, odeabụ a ji abụ a wee na-akpọlite mmụọ na mmasị ndị ọgụụ na ọhanaeze n’ebe ekerechi a dị. Nkeji niile dị n’abụ a gosipụtachara na e nwere ezi mmekọrịta dị n’etiti ekerechi a, mmadụ na ihe ndị ọzọ e kere eke. Odeabụ a ji nkeji nke mbụ na nke atọ wee too ihe ekerechi. O ji nkeji nke abụọ wee zipụta nnukwu ọrụ na ọtụtụ uru ekerechi a baara mmadụ na akụkụ ubi. Na nkeji abụ nke anọ ka odeabụ a gbadoro ụkwụ wee na-ewulite mmasị, nghọta na akọnauche ndị ọgụụ na ọhanaeze n’ebe ihe ekerechi a dị. O sitekwara na nkeji a wee na-echetara ndị ọgụụ oke na ọrụ dịịrị ha n’ilekọta na n’ichekwa ekerechi a. Udele bụ abụ ekerechi ọzọ e sitere n’Akpa Uche wee họrọ. N’abụ a, ekerechi odeabụ a zipụtara na ya bụ anụ ufe a na-akpọ Udele. Dịka a hụrụ n’abụ a kpọrọ “Ijiji”, odeabụ a bụ Nzeakọ zipụtara ọrụ pụrụ iche Chukwu okike kenyere ekerechi a ka ọ na-arụ. O ji nkeji abụ nke mbụ na nke abụọ wee kọwapụta nke IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 91 a. A chọpụtara na ọtụtụ mmadụ na-asọ ekerechi a asọ n’ihi ọrụ a pụrụ iche Chukwu Okike kenyere ya ka ọ na-arụ. Ụfọdụ mmadụ na-eleda ya anya. Ebe ụfọdụ na-ahụtakwa ya ka nnụnụ rụrụ arụ. Mana odeabụ a ji abụ wee na- agbanwe echiche na nghọta ndị ọgụụ gbasara ekerechi a. Na nkeji abụ nke mbụ, odeabụ mere ka a mata na mmadụ kwesịrị ka ọ na-enye ekerechi a ekele n’ihi ọrụ dị mkpa ọ na-arụ. Ọ sị, Mmadụ na-eleda Udele anya; Dị ka nnụnụ rụrụ arụ; Ma o kwesịrị ka e nye Udele ekele; N’ihi ọrụ dị mkpa ọ na-arụ. Na nkeji abụ nke abụọ, odeabụ a kọwapụtara n’uju ọrụ a pụrụ iche e kenyere ekerechi ka ọ na-arụrụ mmadụ. Ọrụ ahụ bụ iri ihe nwụrụ anwụ, nke isi ọjọọ na- apụta na ya na-enye mmadụ ntaramahụhụ. Ọ sị: Mgbe ozu ọkụkọ na ewu tọgbọrọ na-esi isi; Ọ bụghị naanị Udele na-eti aka n’obi; N’ihi ahụhụ mmadụ na-ahụ, n’ihi isi ọjọọ, Udele wee gaa buru ha niile rie. Ọ bụrụ na a gụọ nkeji abụ a nke ọma, a ga-achọpụta na ihe ekerechi a hụrụ mmadụ n’anya ma na-arụkwara ya nnukwu ọrụ. Mana n’akụkụ nke mmadụ, ọ chọpụtachaghị nke a. Ọ bụ ya mere o ji na-eleda ihe ekerechi a anya. Nke a na- egosi na o kwesịrị ka e nwee ezi mmekọrịta n’etitit mmadụ na ekerechi a n’ihi nnukwu ọrụ a na mkpa ọ na-egboro mmadụ. Ihe ekerechi a na-ewepụ isi ọjọọ na-esi na gbururgburu mmadụ. N’ihi nke a, ọ na-eme ka gburugburu mmadụ dị ọcha ma na-esi isi ọma. Site n’abụ a, a ga-achọpụtakwa na ọ bụ mmadụ na- akpaso ihe ekerechi a agwa ọjọọ site n’ileda ya anya. Ọ bụrụ na a gbaso usoro atụtụ kegburugburu wee nyocha abụ a, a ga-achọpụta na ekerechi e zipụtara n’abụ a bụ Udele. Odeabụ a sitere n’abụ a wee zipụta nnukwu ọrụ dị mkpa ihe ekerechi a na-arụrụ mmadụ nakwa uru ọ bara na gburugburu mmadụ. Ọrụ a dị nnukwu mkpa ihe ekerechi a na-arụ bụ ihe gbakarịchara elu n’abụ a. Ọrụ ahụ bụ na ọ na-erikarị ihe dị iche iche nwụrụ anwụ dị ka ozu ọkụkọ na ewu a tọgbọrọ na gburugburu mmadụ, nke na- esikarị mmadụ isi ọjọọ. Site n’ime nke a, ọ na-enye aka edebe gburugburu mmadụ ọcha ma na-emekwa ka ahụhụ mmadụ na-ahụ n’ihi isi ọjọọ a belata. Nke a na-egosikwa na ekerechi a nwere ịhụnanya na ọmịiko n’ebe mmadụ nọ, maka na ọ bụ naanị onye hụrụ mmadụ n’anya ga-egboro ya nnukwu mkpa a. N’agbanyeghị ọrụ a dị nnukwu mkpa ekerechi a na-arụrụ mmadụ, a chọpụtakwara na mmadụ na-akpaso ya agwa ọjọọ. Ọ na-eme nke a site n’ileda ya anya ma na-ahụtakwa ya ka anụ rụrụ arụ. Nke a na-egosi na mmadụ achọpụtabeghị nnukwu ọrụ a na mkpa ekerechi a na-egboro ya. Ọ bụ ya kpatara o ji eleda anya. Mana odeabụ a ji abụ a wee na-akatọ akparamagwa IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 92 ọjọọ a mmadụ na-akpaso ekerechi a. O ji nkeji abụọ mbụ nke abụ a wee na- agbanwe echiche na nghọta ndị ọgụụ gbasara ihe ekerechi a. Ọ na-akọwa na mmadụ kwesịrị ka ọ na-enye ihe ekerechi a ekele n’ihi ọrụ dị mkpa ọ na-arụ. Site na nke a, ọ na-akpọlite mmasị na nghọta ndị ọgụụ na ọhanaeze n’ebe ekerechi a dị ma na-echetakwara ha oke na ọrụ dịịrị ha n’ilekọta na ichekwaba ya. Nkwụ bụ ihe ekerechi ọzọ e sitere n’Akpa Uche wee họrọ. N’ala Igbo, a chọpụtara na osisi nkwụ baara mmadụ uru agaghị agụtanwu ọnụ. Nkwụ bụ osisi pụrụ iche Chukwu okike ji gọzie ndị Igbo. Ndị Igbo na-esite n’osisi a wee na-enweta ihe dị iche iche ha ji enyere ndụ aka. A chọpụtara na ihe niile dị n’osisi a, ya bụ akụkụ ahụ osisi a niile a baara mmadụ nnukwu uru n’ụzọ abụla ụzọ. N’ezie e wezuga osisi a, ndụ ndị Igbo na-ebi n’elu ụwa agaghị atọcha ha ụtọ, ihe dị iche iche ha na-eme agaghị adabacha nke ọma. N’ala Igbo, a maara osisi a dị ka “osisi na-amị ego. N’akwụkwọ abụ a bụ Akpa Uche, a chọpụtara na ndị odeabụ atọ gbadoro ụkwụ n’ekerechi a bụ nkwụ wee depụta abụ ha. Nzeakọ na Ubesie kpọrọ abụ nke ha “Nkwụ”. Mana Madụekwe kpọrọ nke ya “Osisi Na-ami Ego”. A chọpụtara na echiche ndị odeabụ a zipụtara n’abụ ha ndị a bụ otu. Ha gbadochara ụkwụ n’abụ ha wee kọwapụta uru dị iche ihce na mkpa ekerechi a na-egboro mmadụ. Nke a na-egosi na ihe ekerechi a baara mmadụ nnukwu uru. Ebe ọ bụ na echiche dị n’abụ atọ a bụ otu, agaghị atụcha abụ atọ ndị a ebe a. Kama a ga- agbado ụkwụ naanị n’abụ nke Nzeakọ. Ihe kpatara a ga-eji me nke a bụ na a chọpụtara na o zipụtara ihe niile gbasara ekerechi a n’ụzọ doro anya. N’abụ a, Nzeakọ ji nkejiabụ iri na atọ wee kọwapụta n’uju nnukwu uru ekerechi a baara mmadụ. Na nkeji abụ nke mbụ, ọ sị, Ọ dị ọsịsị bara nnụ uru; Ọ dịghị ihe dị n’ahụ ya na-ala n’iyi. Ma mgbe ọ dị ndụ, guzoro ọtọ; Ma mgbe ọ tọgbọrọ n’ala n’ọnwụ. Site na nkeji abụ a, odeabụ a na-akọwa na ihe ekerechi a bara nnukwu uru. N’agbanyeghị ọnọdụ ọbụla ọ nọ, ya bụ, ma ọ dị ndụ, ma ọ nwụrụ anwụ, ọ dịghị ihe dị n’ahụ ya abaghị uru. Na nkeji abụ nke abụọ, odeabụ a kọwara na nkwụ na-enye aka ọrụ. Nke a bụ eziokwu n’ihi na ite mmanya bụ aka ọrụ e ji mara ndị a akpọ Diochi n’ala Igbo. E mekwara ka a mata na a na-esite n’igu nkwụ enweta azịza e ji aza ụlọ na igbegiri, ya bụ ụdị nkụ e ji e si nri. Mmadụ na-ejikwa ogugu si n’osisi nkwụ echekwa akụkụ ubi dị ka ji, ka ome ya ghara ịwụsa n’ala. Ọ sị, Mgbe nkwụ dị ndụ na-eto, Di ochi na-aga tee mmaị IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 93 Igu ya na-enye azịza na igbegiri Ma osisi ya, ka a na-amanyere ji. Echiche Akunne (2014) dabara na nke odeabụ. O kwenyere na azịza a na- enweta na nkwụ na-enye mmadụ ego. O mere ka mata na ọtụtụ ndị ntorobịa enweghị n’oge ugbu a ga-esitenwu n’ịkpụ azịza, igbu akwụ na ite mmanya na- enweta ego ha ji eleta ndụ anya. Na nkeji abụ nke atọ, odeabụ a mere ka a mata na ọ bụghị naanị mmadụ ka ekerechi a baara uru. Kama, ọ bakwaara ụfọdụ anụmanụ dị ka ewu na atụrụ uru. Ha na-esite na ya enweta nri ha ji egbo agụụ. Ọ kọwakwara na mmadụ na-esi na nkwụ enweta ekwere na igu nkwụ o ji agba ogige. Nke a pụtara na nkwụ na-arụkwara mmadụ ọrụ nchekwa n’otu ụzọ. Nke a bụ eziokwu n’ihi na mmadụ jiri ekwere na igu nkwụ wee gbaa ogige n’ụlọ ya maọbụ n’ugbo ya, ọ ga-egbochi ihe ụfọdụ nwere ike imekpa ya ahụ maọbụ ihe ọ kọrọ n’ugbo. Ọ sị, Mgbe agụụ na-agụ ewu na atụrụ; A na-enye ha igu nkwụ ha ataa; Ọ bụ ekwere na igu nkwụ; Ka mmadụ na-eji agba ogige. Na nkeji abụ nke anọ, e zipụtara ihe dị iche iche na-abara mmadụ na anụmanụ nnukwu uru, a na-esi na nkwụ enweta dị ka akwụ, nke na-enye mmadụ akụ na mmanụ. Ọ kọwakwara na ọ bụghị naanị mmadụ ka akwụ baara uru. Kama, ọ bakwaara ụmụ anụmanụ dị ka enwe, ọsa na uze nnukwu uru. A maara ụmụ anụmanụ a dị ka ndị ji akwụ eme nri. Odeabụ a kọwakwara na a na-esi n’akụ enweta ude ma jirikwa ichere akụ emenwu ọkụ. Ọ sị, Akwụ na-enye mmadụ akụ na mmanụ; Ma enwe na ọsa na uze na-ata akwụ; Ọ bụghị n’akụ ka a na-enweta ude? Ma jiri ichere akụ na-emenwu ọkụ. Na nkeji abụ nke ise, odeabụ a kọwara na a na-ejikwa abụrịbụ si n’akwụ emenwu ọkụ. Abụrịbụ a na-abara mmadụ nnukwu uru n’imenwu ọkụ, ọkachasị n’oge udu mmiri. Nke a na-enyekwara ndị na-achụ nta aka n’ihi na ha na-eji ya egwu ọnụ ewi. Ọ kọwakwara na mmadụ na-eji ogugu si na nkwụ were eke elu ụlọ ma na-emekwa nkụ. Ọ sị, Abụrịbụ ka a na-eji emenwu ọkụ; Ma jiri ya na-egwu ọnụ eyi; Ogugu kpọrọ nkụ, ka e ji eke elu ụlọ; Ma jirikwa ya mee nkụ, n’ekwu ọkụ. Na nkeji abụ nke isii, odeabụ a zipụtakwara ihe dị iche iche a na-esi na nkwụ enweta dị ka ngụ, ya bụ ọghịrịgha akwụ a kpọrọ ọkụ, nke mmadụ ji ya na IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 94 mmanụ esi ncha. Mmadụ na-ejikwa uduko nkwụ e tere mmanụ wee na- amụnye ọkụ o ji ahụ ụzọ ọkachasị n’oge abalị. Ọ sị, Oghịrịgha a kpọrọ ọkụ na mmanụ; Ka mmadụ na-eji esi ncha; Uduko nkwụ e tere mmanụ; Ka eji amụnye ọkụ n’oge abalị. Odeabụ a ji nkeji abụ nke asaa, asatọ na nke iteghete wee kọwapụta n’uju nnukwu ọrụ na uru ihe akụkụ ahụ ekerechi a a na-akpọ ọmụ nkwụ baara mmadụ, ọkachasị ndị nọ n’ekpemekpe ọdịnala Igbo. Na nkeji abụ nke asaa, ọ kọwapụtara ihe dị iche iche mmadụ ji ọmụ nkwụ eme. O mere ka a mata na e ji ya ama ogu, jirikwa ya eke ihe okike. E jikwa ya egosipụta ụlọ a na-ere ere n’ike. Ọ sị, Ọmụ nkwụ, ka e ji ama ogu; E jikwa ya eke ihe okike; Mgbe ọbụla e kere ya n’ụlọ gburugburu; O gosiri na a na-ere ya ere n’ike. A chọpụtara na ọmụ nkwụ bara nnukwu uru n’ekpemekpe ọdịnala Igbo. Ọ bụ nke a mere e ji were ya dị ka otu ngwa ekpemekpe ọdịnaala Igbo. Na nkeji abụ nke asatọ na nke iteghete, odeabụ zipụtara ihe dị iche iche ụfọdụ mmadụ ọkachasị ndị nọ n’ekpemekpe ọdịnaala ji ọmụ nkwụ eme. Ọ sị, Ọmụ ka dibịa na-akpa ka nkata; Nke ndị mmadụ na-eji achụ aja. Osisi e gere ọmụ gburugburu’ Bụ osisi ekwensu nke gburu mmadụ Ndị na-agọ mmụọ na-ege okwu arụ sị ha ọmụ, Mgbe ha na-egburu arụsị ha anụ. Ụgbo ala e gere ọmụ n’azụ na n’ihu, Gosịrị na o bu ozu mmadụ. Site n’ihe a kọwapụtara na nkeji abụ ndị a, a ga-achọpụta na ọmụ nkwụ bụ akụkụ ahụ ihe ekerechi a pụtakarịchara ihe ebe a n’ihi ụdị ọrụ e ji ya arụ. A na- ahụta ya dị ka ihe dị asọ. Nke a mere na ọ na-akpalitekarị mmetụtaobi egwu n’ebe ọbụla e kenyere ya. Ihe ndị a niile na-egosi na ọmụ nkwụ nwere nnukwu ọnọdụ na ezi mpụtara na ndụ na nkwenye ndị Igbo. Na nkeji abụ nke iri, e zipụtakwara ụfọdụ uru akụkụ ahụ ekerechi a bakwaara mmadụ. Ọ sị, Ogugu na ekwere ka e ji akpa nkata, Ma jiri ogwe nkwụ mezie ụzọ; Ma ọ bụ warie ya ogologo wee kee ụlọ; Ma ọ bụ gwuo ya n’ala ka ọ bụrụ azụ ụlọ. IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 95 Site na nkeji abụ a, a ga-achọpụta na a na-esitekwa na nkwụ enweta ogugu na ekwere mmadụ ji akpa nkata, nke o ji ebu ihe. E zipụtakwara uru ogwe nkwụ bara na nkeji a. Odeabụ a mere ka a mata na e nwere ike iji ya mezi ụzọ. E nwekwara ike iji ya kee maọbụ wube azụ ụlọ. Na nkeji abụ nke iri na otu, odeabụ a zipụtara uru ọzọ pụtara ihe ekerechi a baara mmadụ. Ọ sị, Nkwụ na-enye mmadụ ọtụtụ ego; Ma ọ chọghị onye ume ngwụ; N’ihi ọtụtụ ọrụ ọ na-enye mmadụ. Site na nkeji abụ a, a ga-achọpụta na nkwụ na-enye mmadụ ọtụtụ ego. Odeabụ a mekwara ka a mata na nkwụ achọghị onye dị ume ngwụ maka na ọ na-enye mmadụ ọtụtụ ọrụ. Nke a na-egosi na ọ bụ ndị gbasiri ike ga-emenwu ihe dị na nkwụ. Nke a bụ eziokwu n’ihi na dị ka odeabụ a si kọwa n’abụ a, na ọ dịghị ihe dị n'ahụ nkwụ na-ala n’iyi, ọ pụtara na nkwụ chọrọ ndị gbasiri ike, ndị ga- enwe ike iji akụkụ ahụ nkwụ dị iche iche wee mepụta ọtụtụ ihe ga-abara mmadụ uru. Odeabụ a jizi nkeji abụ nke iri na abụọ wee kọwapụta ọdịdị nkwụ. O mere ka a mata na nkwụ na-etokarị ogologo. Ọ naghị ebu ibu ka osisi ndị ọzọ. Ọ naghịkwa agbanyesi mgbọrọgwụ ike n’ala. Nke a mere na ikuku na-ebutukarị ya. Ọ sị, Lee ka nkwụ si eto ogologo; Ma ọ bụghị ibu ka osisi ndị ọzọ; Ọ gbanyeghị mkpọrọgwụ nke ọma n’ala; Ya mere, ọ na-ada mgbe ikuku kuru. Na nkeji abụ nke iri na atọ, odeabụ a kọwara na nkwụ nwere obi ọma nke ukwu. Ọ bụ nke a mere na ọ na-azụ mmadụ, nnụnụ na anụ ọhịa nri. N’agbanyeghị nke a, odeabụ a jikwa nkeji abụ a wee rịọ nkwụ arịrịọ ka ọ kwụsị itigbu ọkụkọ. Nke a na-egosi na nkwụ na-etigbukarị ọkụkọ oge ọbụla ọ daturu n’ala, n’ihi na ọ naghị agbanyesi mgbọrọgwụ ike n’ala ka osisi ndị ọzọ. Ọ sị, Nkwụ nwere obi ọma nke ya; Na-azụ mmadụ, nnụnụ na anụ ọhịa; Ma ọ dị arịrịọ m ga-arịọ gị; Ka ị ghara itigbu ọkụkọ ọzọ. Site na nkeji abụ a, a ga-achọpụta na ọ bụghị naanị mmadụ ka ihe ekerechi a bụ nkwụ baara nnukwu uru. Kama ọ bakwaara anụ ufe na anụ ọhịa dị iche iche nnukwu uru. Ha na-esi na nkwụ enweta ihe oriri. Ọzọ, a ga-achọpụtakwa na o nweghị ụzọ ọbụla e zipụtara ihe ekerechi a si emekpa mmadụ ahụ. Mana ọ na- emekpa ụfọdụ ihe e kere eke ahụ dị ka ọkụkọ. Ọ bụ nke a mere odeabụ a ji jiri abụ a wee rịọ nkwụ arịrịọ ka ọ kwụsị imekpa ọkụkọ ahụ. IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 96 Ọ bụrụ na agbaso usoro atụtụ kegburugburu wee nyochaa abụ a, a ga-achọpụta na ekerechi e zipụtara n’abụ a bụ osisi a na-akpọ Nkwụ. Odeabụ a sitere n’abụ a wee zipụta na e nwere ezi mmekọrịta n’etiti ihe ekerechi a na mmadụ. O mere ka a mata na ihe ekerechi a baara mmadụ nnụ uru. Ya bụ a gaghị agụtanwu uru dị iche iche ekerechi a baara mamdụ. Nke a bụ eziokwu n’ihi na odeabụ a mere ka a mata na ọ dịghị ihe dị n’ahụ ekerechi a na-ala n’iyi. Akụkụ ahụ ya niile bachaara mmadụ uru. Ọ na-enye mmadụ mmanụ, akụ, ekwere, ogugu, ọmụ, azịza, ngụ, abụrịbụ, dgz. Mmadụ na-erekwa ihe ndị a wee na- enweta ego. Odeabụ a kọwakwara na ọ bụghị naanị mmadụ ka ihe ekerechi a baara uru. Kama ọ bakwaara nnụnụ na anụ ọhịa dị iche iche uru. Ha na-esi na ya enweta ihe oriri. Ụfọdụ ụmụ anụmanụ jikwa ya mere ebe obibi. N’abụ a, e nweghị ka e si zipụta mmekpaahụ ihe ekerechi a na-enye mmadụ. Kama e mere ka a mata na ọ na-emekpa ụfọdụ ihe e kere eke dị ka ọkụkọ ahụ. Nke a pụtara na e nwere ezi mmekọrịta n’etiti mamdụ na ekerechi a. Ihe gbakarịrị elu n’abụ a bụ uru dị iche iche ekerechi a baara mmadụ. Odeabụ ji nkeji abụ a niile wee zipụta uru ndị ahụ n’otu n’otu. Ọ gbadoro ụkwụ na nke a wee na- akpọlite mmasị ndị ọgụụ n’ebe ekerechi a dị. Site n’uru ndị a ọ rụtụrụ aka, ọ na- echetara ndị ọgụụ na ọhanaeze oke na ọrụ dịịrị ha n’ilekọta na n’ichekwa ekerechi a. Nchịkọta N’ederede a, e lebara anya n’ọnọdụ ekerechi n’agụmagụ Igbo. A chọpụtara na ndị odee agụmagụ Igbo ọkachasị ndị odeabụ Igbo na-ezipụta ekerechi dị iche iche n’ọrụ ha. Ha na-esite n’abụ ha too ekerchi dị iche iche, zipụta nkamma ha na mmekọrịta dị n’etiti ekerechi na agbata mmadụ. N’abụ a kpọrọ “Egwurugwu”, odeabụ a sitere n’abụ a zipụta nkamma ekerechi a a na-akpọ egwurugwu. N’abụ a, e zipụtakwara mmekọrịta dị n’etiti mmadụ na ekerechi a. A bịa n’abụ a kpọrọ “Uduma-Mmiri Ọma”, odeabụ zipụtara uru pụrụ iche ekerchi a baara ndị obodo a na-akpọ Uduma. N’abụ a kpọrọ “Udele”, odeabụ a kọwapụtara na ekerechi a na-arụ ọrụ pụrụ iche na gburugburu mmadụ. Ọ na- egbochi isi ọjọọ na gburugburu mmadụ. A bịakwa n’abụ a kpọrọ “Nkwụ”, odeabụ a zipụtara uru dị iche ekerechi baara mmadụ. O mere ka a ghọta na ndụ mmadụ na-adị dabeere n’ekerechi a n’ihi na ihe niile dị na Nkwụ baara mmadụ uru. Site n’ihe ndị a a chọpụtara, a ga-ahụ na ọ dị mkpa ka ndị onyocha agụmagụ Igbo gaa n’ihu n’inyocha ekerechi dị iche a na-ezipụta n’agụmagụ Igbo. Nke a ga-enye aka n’ịkpọlite echiche na mmụọ ndị ọgụụ n’ebe ekerechi ndị a dị nakwa oke na ọrụ dịịrị ha n’ichekwa ha na gburugburu ha. IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 97 EDEMSIBỊA Akporobaro, F. B. (2008). Introduction to Poetry, Lagos: Princeton Press. Akunne, C. E. ( 2011). “Ecological Studies on Honey Bee (Apis Mellifera L.) in Relation to Optimal Production of Honey in Awka”, PhD Dissertation, Nnamdi Azikiwe University, Awka. Akunne, Ewuim, Ngenegbo, Ononye na Abajue (2014) “Apitherapy: A Complementary Therapy in Health Care Delivery in Nigeria”, a Conference Paper Presented at the 45th Annual Conference of Entomological Society of Nigeria, Abuja, 7th-10th October, 2014. Anike, O.L (2014) “Severe Environmental Degradation in The Southeastern Nigeria and their Socio-Economic And Political Implications: A Need For Advocacy” in Nnyigide, N.M., Ezeuko, R., Nwokoye, A. N. & Eyisi, J. (Eds.), The Eagle of Igbo Literature: Festschrift in Honour of Professor Goddy Onyekaonwu.Nimo: Rex Charles Patrick. Bergthaller, H. (2014). “What is Ecocriticism” URL: http:www.easlce.eu/abut.u/… Accessed: 17tyh August, 2014. Dobie, A. B. (2012) Theory into Practice: An Introduction to Literary Criticism. Boston: Wadsworth. Ekechukwu, R. M. (Ed). (1975). Akpa Uche. Lagos: Oxford University Press. Ekwealor, C. (2009) Agụmagụ Ederede Igbo. Nsukka: Paschal Communications. Gerrard, G. (2004). Ecocriticism, London: Routledge. URL: http://www.alse.org.uk. Accessed: 17th August, 2014. Glotfelty, C. ( 1996). “The Ecocriticism Reader: Landmarks in Literary Ecology” in Glotfelty, C. and Harold, F. ( Eds.), Literature and Ecology. Athens: University of Georgia Press. Igbokwe, B. N. (2014) “Culture: A Road Map Towards Achieving the Millenium Development Goals on Health” in Nnyigide, N.M., Ezeuko, R., Nwokoye, A. N. & Eyisi, J. (Eds.), The Eagle of Igbo Literature: Festschrift in Honour of Professor Goddy Onyekaonwu.Nimo: Rex Charles Patrick. IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol. 3 No 4, June 2017. ISSN: 2488-9210(Online) 2504-9038(Print) (A Publication of the Augustinian Institute) 98 Nwadike, I. U. (1992) Ntọala Agụmagụ. Nigeria: Ịfunanya Publishers. Nwadike, I.U. (2004). Echiche Miri Emi. Onitsha: Kawuriz and Manilas Publishers. Nwokolo, O. (2013). “The 2012 Flooding at Onitsha in Okoye, I.C. (Ed.) Calvary Compass, Awka: SCOA Heritage, pp. 77. Odibo, F. J. C. and Archibong, E. J. (2014) “Palm Wine: A Repository of Food and Industrial Yeasts” in Nnyigide, N.M., Ezeuko, R., Nwokoye, A. N. & Eyisi, J. (Eds.), The Eagle of Igbo Literature: Festschrift in Honour of Professor Goddy Onyekaonwu.Nimo: Rex Charles Patrick. Okediadi, N. A. (2003) Ije Ụwa. Enugu: Fulladu Publishers. Osazuwa, J. (2014, September 4) “The Wonders of Bitter Leaf”. Daily Sun. pp.25. Philips, D. (1999), “Ecocriticism, Literary Theory and the Truth of Ecology” in New Literary Hisotry, John Hoopkins University. John Hopkins, pp. 577-602. URL: http://www.jstor.org/stable/... Accessed 14th January, 2010. Tosić, J. (2006). “Ecocriticism-Interdisciplinary Study of Literature and Environment” in Working and Living Environmental Protection, pp. 43-50 URL: googlesearch.org. Accessed 17th August, 2014.