IGWEBUIKE: An African Journal of Arts and Humanities Vol 9 No.1, 2023 www.igwebuikeresearchinstitute.org/igwebuikejournals.php A Publication of the Department of Philosophy and Religious Studies, Tansian University, Umunya 132 MMEBE NA NTỤGHARI MKPỤRỤOKWU BEKEE N’IGBO: NSOGBU NA ỤSA NYE YA Daniel Ihunanya Ilechukwu Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka di.ilechukwu@unizik.edu.ng Na Christian E. C. Ọgwụdịle Ngalaba Amụmamụ Igbo, Afrịka na Nzikọrịtaozi Mahadum Nnamdị Azikiwe, Ọka DOI: 10.13140/RG.2.2.27610.21449 Ụmị Ederede Mgbe ọ bụla a na-ekwu maka ntụgharị, ihe ọzọ a na-ajụ ase ya bụ mkpụrụokwu a ga-atụgharị. Mkpụrụokwu dị ome ntụgharị nnukwu mkpa. O nwere ike ịbụ mkpụrụokwu agụmagụ, nka na ụzụ ma ọ bụ nke mkpokọta ka ọ chọrọ iji hụ na ntụgharị ya bụ kpoo. A na-emepụta mkpụrụokwu ọhụrụ dị iche iche na mba ụwa dị iche iche iji nwee aha a ga na-akpọ ọtụtụ ihe ọhụrụ na-apụta kwa ụbọchị n’ụwa taa. Mana ọ bụ ihe mwute na asụsụ Igbo etorubeghị ka asụsụ ndị a a na-ekwu maka ha n’ụwa taa dị ka Bekee, French, Jaman, Chaịna, wdg. Ndị ọka ntụgharị n’onwe ha na-agabiga ihe nhịam ahụ dị egwu mgbe ha na-emepụta okwu ohụrụ. Ederede a lebara anya na nsogbu dị iche iche a na-agabiga n’imebe mkpụrụokwu ọhụrụ n’Igbo, mbọ ndị ọka mmụta gbarala na ihe ndị a ga-eme iji belata nsogbu ndị a. A gbasoro atụtụ nṅomite, ndaịta na nke mmebe mkpụrụokwu nke (Ajụnwa 2014). A gbasoro nsoro nkanye akara ụdaolu ke Green na Igwe (1963), bụ nke maziri na a ga-akanye akara n’ụda ala na ụda nsụda naanị ka ụda elu wee ghara ibu akara ọ bụla. Dị ka e nwere usoro ndekọ na ndesa n’odide asụsụ Igbo, a gbasoro usoro ndesa n’ide mkpụrụokwu ndị dị n’ederede a. Naanị mkpụrụokwu ndị e dekọrọ ọnụ bụ ndị e dekọrọ ọnụ n’akwụkwọ Ọkaasụsụ Igbo bụ nke ndị otu a kpọrọ SPILC dere. Ederede a ga-aba uru n’ụlọ akwụkwọ niile a na-amụ asụsụ Igbo nye ndị nkụzi na Daniel Ihunanya Ilechukwu & Christian E. C. Ọgwụdịle 133 ụmụ akwụkwọ. Ndị ụlọ mgbasa ozi na otu ISA ga-eritekwa nnukwu uru na mkpụrụokwu ọhụrụ ndị e mebere. O kwesịrị ka e tutekwa otu SPILC na ISC (The Igbo Standardization Committee). Gọọmentị kwesịrị itinye aka n’ihe gbasara ịzụpụta ndị ntụgharị na ndị mmebe okwu. E kwesịrị iwube ọba akwụkwọ ebe a ga na-achọta okwu ọhụrụ ndị e mebere. Mkpọlite Mmebe mkpụrụokwu pụtara ichepụta mkpụrụokwu ọhụrụadịbughị mbụ maka okwu mbịa mbịa ọhụrụ batara n‟asụsụ. A bịa n‟ihe gbasara ntụgharị, ọtụtụ ndị ọka mmụta dị iche enyela nkọwa dị iche iche gbasara ihe ọ pụtara. Na nchịkọta nkọwa niile ha nyere, a ga-asị na ntụgharị bụ s n‟otu asụsụ gbanwegharịa ederede n‟asụsụ ọzọ maka inwe nghọta ihe e dere. Mmebe mkpụrụokwu na ntụgharị bụ aka nrị na aka ekpe maka na omepụta mkpụrụokwu na-echepụta okwu ome ntụgharị ji arụ ọrụ ya. Ya bụ na ọ pụtara na ome ntụgharị na-ejekwuru omepụta mkpụrụokwu maka inweta mkpụrụokwu ọhụrụ o ji arụ ọrụ. Dị ka a maara nke ọma na ụwa anyị bi n‟ime ya na-emepe ọsọ ọsọ kwa ụbọchị. Dị ka mmepe a na-aga n‟ihu, ọtụtụ ihe ọhụrụadịbughị mbụ na-awụpụta kwa ụbọchị bụ ndị anyị na-anụ maka ha mgbe niile. Ihe mmepụta ọhụrụ ndị a enwebeghị ihe a na- akpọ ha n‟asụsụ dị iche iche, tụmadụ n‟obodo ndị ka na-emepe emepe dị ka Igbo, Awụsa, Yoruba, wdg, iji hụ na onye ọ bụla ghọtara ihe ha bụ. Iji maa atụ, n‟oge mbụ, e nwebughị ihe ọ bụla a na-akpọ university, computer, percent, mornitor, wdg. Ọ bụrụ na ndị nọ n‟ime obodo ga-aghọta ihe okwu ndị ahụ dị n‟elu na ndị ọzọ pụtara, ọ dị mkpa na a ga-atụgharị ha n‟Igbo. Ọ bụrụ na e mee nke a, “university” ga-abụ “mahadum,”“computer” ga-abụ igwe ozi, “percent” ga-abụ ndịnarị ebe “mornitor” ga-abụ enyo ngosi, wdg. Ihe ọzọ dịzi mkpa bụ ime ka okwu ndị e mepụtara ọhụrụ na ndị a tụgharịtara n‟Igbo gbasaa ma guzosie ike. Tupu nke a adị ire, ọ dị mkpa ikwu na ndị Igbo niile aghaghị inwe otu kwudosiri ike ga na-ahụ maka inyocha okwu ọ bụla e mebere ọhụrụ, hụ na ọ dabara ma nabata ya ka ọ banye n‟ọnụọgụmkpụrụokwu dị nankọwaokwu asụsụ Igbo. Gbasara nsụpe asụsụ Igbo n‟ederede a, rukwee taa, a ka na-enwe ndọrọ ndọrọ gbasara ndekọ na ndesa asụsụ Igbo. Ọ bụ ya kpatara na e nwere otu abụọ gbasara ndekọ na ndesa asụsụ Igbo. Ihe ọ pụtara bụ na odee ọ bụla nwere ike ịhọrọ idesa okwu edesa ma ọ bụ idekọ ya ọnụ ma kwụdosie ike na nke ọ bụla ọ họọrọ. N‟ihi Mmebe na Ntụghari Mkpụrụokwu Bekee N’igbo: Nsogbu na Ụsa Nye Ya 134 ọnọdụ a, odee ederede a họọrọ idesa okwu edesa bụ nke kara daba n‟usoro ụtọasụsụ Igbo maka na ndị na-edekọ ọnụ bụ asụsụ Bekee ka ha na-elere anya eme nke a. Iji ma atụ, ọ bụrụ e nwere ihe dị ka teachers na Bekee, ndị ndekọ elere anya na ọ bụ otu okwu na Bekee mee ya otu okwu n‟Igbo ebe o doro anya na asụsụ ọ bụla nwere ụdịdi ya.Mana e dekọrọ mkpụrụokwu ndị ahụ e dekọrọ ọnụ n‟akwụkwọ Ọkaasụsụ Igbo nke ndị otu SPILC dere. Ọnọdụ Mkpụrụokwu Igbo n’Oge Ugbu A Ọtụtụ ndị ọka mmụta na ndị Ihe gbasara asụsụ Igbo na-amasị agbaala mbọ ole ike kwere ha iji hụ na asụsụ Igbo towanyere na mkpụrụokwu ọhụrụ. Ndị mme ntụgharị na ndị na-emebe mkpụrụokwu emebela ọtụtụ mkpụrụ okwu maka ngalaba dị iche iche metụtara asụsụ Igbo. Otu ihe jọrọ njọ na mbọ a ndị dị iche iche na-agba bụ na ọ bụghị ha niile bụ ndị tozuru imepụta mkpụrụokwu ma ọ bụ tụgharịta mkpụrụokwu dabara adaba. Iji maa atụ, e nweela ọtụtụ mkpụrụokwu ndị ọka mmụta tozuru mepụtara ọhụrụ makpucha n‟ụlọ akwụkwọ ha dị iche iche na-eche ndị ga-ewere ha tinye n‟ọrụ, ebe ndị mgbasa ozi (ndị nta akụkọ) asụsụ Igbo na-eji aka ha mebe mkpụrụokwu ndị adabaghị adaba ma na-agbasi mbọ ike ka ọ gbasaa ebe niile. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ị na-ege akụkọ ụwa nke ọma n‟Igbo, ị ga-achọpụta na ihe ndị mgbasa ozi na-akpọ „permanent secretory‟ bụ ode akwụkwọ ọkpụtọọrọ ọkpụ, n‟ihi na ha amaghị na ihe ọ bụla dị ọkpụtọọrọ ọkpụ enweghị njedebe, mana „perm sec‟ na-emechaa laa ezumike nka. Mmadụ nwere ike ịsị na Chukwu dị ọkpụtọọrọ ọkpụ mana e nweghị ike ịsị na mmadụ ọ bụla dị ọkpụtọọrọ ọkpụ. Ya bụ na ihe anyị na- ekwu bụ na okwu ka mma maka ‘permanent secretory’ bụ ode ‘akwụkwọ ndịgide.’ Ihe kpataranke a bụ na ihe ọ bụla na-adịgide adịgide nwere mgbe ọ na- anọgịde jedebe mana ihe dị ọkpụ tọọrọ ọkpụ enweghị njedebe ọ bụla. Mgbe ụfọdụ, anyị ga-achọpụta na e nwere okwu ndị a na-enwe mgbagwoju anya na ntụgharị ha ma ọ bụ na mpụtara ha. Ijioma (2006) ji ọmụma atụ a dị n‟ala kọwaa ihe a na-ekwu nke ọma: Ọmụma atụ nke mbụ. a. “Bomb” b. “Nuclear weapon” c. “Explosive” d. “Chemical weapon” Daniel Ihunanya Ilechukwu & Christian E. C. Ọgwụdịle 135 Okwu Bekee ndị niile dị n‟elu bụ ‘ogbunigwe’ ka ndị Igbo na-akpọkọta ha niile, ebe anyị ma na n‟ihi ụdịdị ha na etu ha si akpa agwa na ndị mebere ha nyere ha ụdịrị aha dị iche iche. Gịnị kpatara na Igbo agaghị enwenwu aha ha n‟iche n‟iche? Ọ bụ maka na ọ dị ka a ga-asị na ọ ga-ahịa ahụ inwe aha ga-adaba na nke ọ bụla n‟ime ha. E nwere ike inye ha aha otu otu etu a: a. Bomb - gbun gw mgbukpọ b. Nuclear weapon – Ogbunigwe nkụkọta c. Explosive - Ogbunigwe mbigbọ d. Chemical weapon – Ogbunigwe mmiri mmụọ N‟ọmụmaatụ ndị dị n‟elu, „bomb‟ bụ ngwa agha e ji egbukpọ ndị niile nọ n‟ebe a tụrụ ya. “Nuclear weapon” bụ ngwa agha na-akụkọ ọnụ tupu ọ dọta ọkụ ọ ga-eji gbu ihe dị ya nso. “Explosive” bụ ụdịdị ogbunigwe na-agbasa mgbe ọ na-egbu mmadụ, ebe “Chemical weapon” bụ ogbunigwe nwere mmiri nsi na-enyere ya aka igbu ọtụtụ mmadụ n‟otu oge. A gbasoro usoro mmebe mkpụrụokwu wee tụgharị ha. Ọmụma atụ ọzọ ebe a na-enwe obere mgbagwoju anya n‟okwu ụfọdụ bụ n‟okwu ndị a e nwetara n‟akwụkwọ Nwaozuzu na Mba (2013). I lee anya ị ga-achọpụta na ọ bụ otu aha ka ndị Igbo ụfọdụ na-enye okwu Bekee ndị a e depụtara n‟okpuru: a. “eye brow” b. “eye lash” c. “eye lid” Ọ bụrụ nae wezuga ihe ọmụmụ a, ọ bụghị ndị igbo niile maara ihe dị iche na aha otu mkpụrụowu ndị ahụ dị n‟elu na ibe ya. Ihe e ji kwue etu a bụ na aha ọtụtụ n‟ime anyị na-akpọkọta ha mbụ bụ ‘iku anya.’ Mana ndị ọka mmụta a kporọ aha n‟elu mere ka anyị mata aha mkpụrụokwu atọ ndị ahụ ka mgbagwoju anya ghara ịdịkwa ọzọ. Lee ha: a. Eye brow - k anya b. Eyelid - egb gb r any c. eyelash - m b b any O nwere ụfọdụ ọrịa ndị na-ere ọgwụ n‟akụkụ ụzọ na kwa n‟ahịa na-akpọ ọrịa nsi nwaanyị, mana i nyochaa nke ọma ị ga-ahụ na ọrịa ndị ahụ adabaghị ịkpọ ụdị aha a ma ncha. Ha gụnyere: a. Syphilis b. Gonococcus c. Gonorrhea d. Candidiasis Mmebe na Ntụghari Mkpụrụokwu Bekee N’igbo: Nsogbu na Ụsa Nye Ya 136 Ọ bụrụ na ị na-ege ndị na-ere ọgwụ Igbo n‟ebe dị iche iche ntị, ị ga-achọpụtalarị na mgbe ha na-akọwa maka ọgwụ ha na-ere, ihe ha na-ekwukarị bụ, “ Ọgwụ anyị na- agwọ ọrịa nsi nwaanyị dị iche iche dị ka: sifilis, gonoria, gonokakus, kandịdaịsis. Ndị ọkacha mara n‟ihe gbasara ahụ ike mere ka anyị mata na ọrịa ndị ahụ bụ ndị a na-enweta site n‟ụdị nje dị iche iche. Nke pụtara na nwoke bu nje ahụ n‟ahụ ya nwere ike ibunye ya nwaanyị n‟ebughị ya ma ha nwee mmekọ; n‟aka nke ọzọ, nwaanyị nwere nje a nwere ike ibunye ya nwoke enweghị ya n‟ahụ ma ọ bụrụ na ha enwee mmekọ. Gịnị kpataziri a ga-eji gụpụ nwoke kpọọ ya ọrịa nsi nwaanyị ka a ga- asị na ọ bụ ụmụ nwaanyị naanị na-efesa ya. Kama ịkpọ ha ọrịa nsi nwaanyị, ọ ka mma na a kpọrọ hantịrịdị ka ndị Igbo si mara ha, ma ọ bụ ọrịa nsi nwoke na nwaanyị, ma ọ bụ a na-akpọ ha ihe ha na-aza na Bekee n‟Igbo ka a ghara inwe mgbagwoju anya. Ya bụ na odee kwenyere na aha ọrịa dị iche iche nwere ike ịga n‟ihu na-aza aha ndị chọpụtara ha nyere ha na mbụ dị ka e si eme ya n‟aha mmadụ. Ọ bụrụ na a na-akpọ ha ihe ndị chọpụtara ha nyere ha, ị mara na agaghị na-enwe mgbagwoju anya na mpụtara ha ma ọlị. Nwosu (2010) na ndị otu nchọcha ya mebere mkpụrụokwu dị iche iche maka ọrịa ndị ka eche ndị mmadụ aka mgba n‟oge ugbu a. Lee ha n‟okpuru: a. Malaria Ịb anwụnt b. Diabetes Ọrị shug c. Stroke Ọtụọ ọ k r d. Cancer Ọpụọọgbasaa e. Asthma Ụkwar nwamb f. HIV/AIDS je m m nwụ g. Hepatitis Amaahị umeju h. Infection Ọrị nj Ọ bụrụ na e sekee mkpụrụokwu ndị a n‟ otu n‟otu, ị ga-ahụ na ihe e ji kpọọ malaria ịbaanwụnta bụ maka na ihe na-atanye mmadụ „malaria‟ n‟ahụ bụ anwụnta. Diabetes metụtara shuga. Iji maa atụ, onye na-arịa “diabetes” anaghị eri ihe shuga dị nnukwu ka shuga dị ya n‟ahụ ghara ịkarị akarị. Mana odee na-ekwu na ọ gaara ịka mma ka a kpọọ ya ọrịa mmamịrị maka na o nweghị ihe ọzọ onye a na-arịa mgbe niile n‟abụghị ịgba tụụtaa ebe ọ na-achọ ebe ọ ga-anyụ mmamịrị. Ọ bụrụ na ọrịa „stroke‟ abịakwasa mmadụ na mberede, ihe ọ na-eme bụ ijide ya otu ọkara ahụ kpọnwụọ, ọ bụ ya kpatara e ji kpọọ ya ọtụọ ọkara.Ngwa ngwa “cancer” bara mmadụ ahụ, ihe ọ na-eme bụ ịgbasa n‟akụkụ ahụ ndị ọzọ. Ọ bụ ya kpatara na ọ bụrụ na o nweghị ihe e mere ya, ọ gbasaa ebe niile ma gbue onye o ji. Ya kpatara e ji Daniel Ihunanya Ilechukwu & Christian E. C. Ọgwụdịle 137 kpọọ ya ọtụọ ọgbasaa.Onye na-arịa ọrịa „asthma‟ na-akwa ụkwara ka nwamba, ya bụ ụdị ụkwara anaghị ekwe nkwapụta nke ọma. Ọ bụ ya kpatara e ji kpọọ ya ụkwara nwamba. Nwosu kpọrọ “HIV/AIDS” nje mminwu. Ihe kpatara ya bụ maka na ọ bụ nje bụ ihe ahụ na-amịkpọ onye ọ bụla orịa a ji rukwee mgbe o dulara ya mmụọ.“Hepatitis” bụ ọrịa na-akpọnwụ umeju kpamkpam. Ụfọdụ na-akpọ ya ọrịa ndị ọgaranya maka na ihe ọ na-ewe iji gwọ onye ọ na-arịa abụghị obere ihe. A sị na mmadụ nwere „infection,‟ ihe a na-ekwu bụ na o nwere nje bara mmadụ ahụ ma kpalieere ya otu ọrịa n‟ahụ. Ọ bụ ya kpatara e ji kpọọ “infection” ọrịa nje. Ya bụ ọrịa nje na-ebute. N‟ebe ọ metụtara amụmamụ nkọwaokwu ndịnasụsụ, Mba et al (2013, tụgharịrị mkpụrụokwu Bekee ndị a n‟Igbo: a.) Abbreviation Ị ch fụ b.) Abridged dictionary Ọ kọwa okwu nhọ rọ ch.) Acronym Ndeb risi d.) Archaic tamchar e.) Alphabetization Nh zi N‟Us r Abịịchị f.) Bilingual dictionary Ọ kọwa okwu sụm bụ ọ g.) Canonical form kwu z gbe gb.) Collocation Ngakọ okw gh.) Concordance Ndokọ okw gw.) Lexicography ka odide ọ kọwa okwu h.) Electronic dictionary Ọ kọwa okwu kọ mput i.) Encyclopaedia Ọ kọw m okw ị.) Ghost word Okwu ndịhị J.) Illustration Ns gosi k.) Lexicographer Ode ọkọwa okwu kp.) Paraphrase Ndegharị kw.)Unabridged dictionary Ọ kọwa okwu dum l.) Zero morphine Mọfịm efu m.) Valency chọmụmmeju n.) Syntagmatic criteria Ụzọ ntinyekọ okw Odee chọpụtara na e nwere okwu ndị tofere ofe na ntụgharị ndị a dị n‟elu na ndị riri obere mperi. Iji maa atụ, na (e) ebe e nwere „alphabetization‟ ome nchọcha na-atụ aro na ọ ga-aka mma ịkpọ okwu ahụ nsonabịdiị kama itụgharị ya n‟ụdịdị ahịrịokwu e tinyere ya bụ, „nhazi n‟usoro abịchịị.‟ Na (L) dị n‟‟elu ome ntụgharị sị na e nwere Mmebe na Ntụghari Mkpụrụokwu Bekee N’igbo: Nsogbu na Ụsa Nye Ya 138 ike inwe naanị ọkọwami ma ọ bụ ọkọwazu, kama itinyebe mkpụrụokwu ka ọ ghara ito oke ogologo. Ndegharịdị ka ọ dị na (p) nwekwara ike ịza nkwugharị. ‘Mọfịm efu dị ka ọ dị na (r)n‟elu nwere ike iza aha Igbo n‟ozuzu oke. E nwere ike ịkpọ ya mkpụrụ asụsụ efu. E wezuga ndị a a rụtụrụ aka, ndị ọzọ dabara nke ọma etu e si chọọ. Nnaji (1995), tụgharịrị okwu bekee ndị a etu a n‟asụsụ Igbo: a. Martinet Onye na-eme ka ndị n‟adịghị erube isi rube is n‟ike b. Massacre Igbu aghara aghara ch. Masturbation Ịkpali ihe mmadụ ji bụrụ nwoke nke e ji aka mee d.Matador Onye na-egbu enunu n‟ọgụ e. Matrimony Ọlụlụ di na nwunye f. Mattock Igwe e ji akụri ihe g. Obedience Ịkpọ isi ala Ezi ome ntụgharị ọ bụla agaghị eche ka agwa ya na ntụgharị ndị a dị n‟elu adabachaghị etu kwesịrị. Ụfọdụ n‟ime ha toro oke n‟ogologo. me nchọcha ederede a na-ekwu na ọ ga-aka mma na a tụgharịnworo okwu Bekee ndị ahụ dị n‟elu etu a: a. Martinet Ọzụru b. Massacre Mgbupịa c. Masturbation Aramonwe d. Matador Ogbu enunu e. matrimony Alụmalụ f. Mattock Igwe nkụri g. Obedience nrube isi I lee anya ị ga-ahụ na o nweghịzi mkpụrụokwu n‟ime ndị a tụgharịnworo nwere karịa mkpụrụokwu abụọ. Ntụgharị na-aka mma na iji otu okwu tụgharị otu okwu. Ọ bụ ezi okwu na nke a anaghị adịkarị mfe n‟asụsụ Igbo mana ọ bụrụ na a gbasie mbọ ike, a ga-ebelatanwu oke iji ahịrịokwu tụgharị otu mkpụrụokwu n‟Igbo. Ọ bụrụ na a ga-emenwu nke a, a ga-akwụsị ile anya n‟ihe ọtụtụ okwu e ji tụgharị otu okwu pụtara iji ma ma o zipụtakwara ihe a tụgharịrị nke ọma, kama ihe a ga na-eme bụ ịchọta otu mkpụrụokwu kpọọ ya aha anụbeghị mbụ. Mgbe agaghị ete aka, onye ọ bụla amara ya ma kwụsị ịjụ ihe ọ pụtara. Echerue (2006), n‟akwụkwọ ya ọ kpọrọ Igbo – English dictionarytụgharịrị okwu ndị a etu a n‟okpuru: a. Agreement Nkwekọrịta b. Good bye De eje Daniel Ihunanya Ilechukwu & Christian E. C. Ọgwụdịle 139 c. Gossip Takaa ntaka d. Greedy Too akpịrị Na (a) dị n‟elu, ebe ọ bụ na e nwere „general‟ na „disagreement,‟ ọ ka mma na e tinyere izugbe na ya ka o wee zue oke, ya bụ, nkwekọrịta izugbe, kama naanị nkwekọrịta. A bịa na (b), de eje bụ asụsụ Nsụka dị na steeti Enugwu. O nweghị mgbe ndị Igbo kwenyere na a ga na-akpọ “good bye,” de eje, kama ihe e ji mara ya kemgbe ụwa bụ jee nke ọma, ebe „safe journey‟ bụ ije ọma.“Gossip” kwesịrị ịbụ asịrị, ọ bụghị „takaa ntaka,‟ebe „greed‟ kwesịrị ịbụ anya ukwu. Nsogbu A Chọpụtara A dịlarị na mbụ chọpụta na ọ dịghị ihe ọ bụla e ji ọtụtụ nchọcha e merela gbasara mkpụrụokwu Igbo eme n‟agbanyeghị ahụhụ niile ndị mere nchọcha ndị a tara n‟ije ozi ha. Ọ dịkwa mkpa ka a rụtụ aka na n‟agbanyeghị na ọtụtụ ndị ọka mmụta na ụmụ akwụkwọ Igbo agbaala mbọ imepụta mkpụrụokwu ọhụrụ dị iche iche mana nke bụ eziokwu bụ na akpabeghị nwa agụ aka n‟ọdụ n‟ihe gbasara imepụta ma ọ bụ tụgharịta mkpụrụokwu ndị ga-azaba aha ọtụtụ ihe enwebeghị ihe a na-akpọ ha n‟Igbo. Nnukwu nsogbu ọzọ Igbo na-agabiga ugbua bụ ihe gbasara enweghị t ndị Igbo niile nabatara ga na-anabata okwu ọhụrụ Igbo ọ bụla ma mee ka o zuo Igbo niile ọnụ. Otu SPILC bụ ndị na-emebu nke a na mbụ anwụruola ala. Ọ bụzi otu ISA ka a na-ekwu maka ya ugbu a mana nke bụ eziokwu bụ na otu a ejibeghị ọkpa abụọ kwụrụ chịm chịm n‟ala n‟ije ozi a chọrọ n‟aka ya. Nke kazi njọ ugbu a bụ nsogbu enweghị ego a ga-eji jee ozi ma ọ bụrụgodi na e nwee otu ndị ga na-ahụ maka ịhazi okwu ọhụrụ. Ụfọdụ n‟ime ndị malitere nchọcha n‟ihe gbasara imebe mkpụrụokwu agbahapụla ọrụ ha tara ahụhụ malite n‟ihi enweghị ego a ga-eji rụtọpụ ya. Otu nsogbu ọzọ a ga-agbasi mgba ike bụ etu ndị ụlọ mgbasa ozi si emepụta okwu ọhụrụ aghara aghara n‟ebughị ụzọ chere ka e nyochaa, hazie ma nabata okwu ndị ahụ. Ọnọdụ dị etu a agaghị enye aka ma ncha gbasara nhazi a na-agba mbọ ka a hazie asụsụ igbo ma ncha. Ọtụtụ okwu ndị e mepụtara emepụta agbasoro usoro nhazi mkpụrụokwu nke o zuru ụwa, nke mere na mgbagwoju anya nke mputara mkpụrụokwu dị ọtụtụ n‟asụsụ Igbo taa. E nweghị ọkọwa okwu a sara anya na mmiri dee bụ nnukwu nsogbu na-echere asụsụ Igbo aka mgba n‟oge ugbu a, ebe ọ bụ na Igbo kwesịrịrịị inwe nkọwaokwu asụmabụọ (bilingual dictionary), ọkọwami okwu Mmebe na Ntụghari Mkpụrụokwu Bekee N’igbo: Nsogbu na Ụsa Nye Ya 140 (encyclopaedia), nkọwaokwu nsipu (etimological dictionary), nkọwaokwu eserese (pictiorial dictionary), nkọwaokwu mkpọpụta (pronouncing dictionary), wdg. Aro Ome Nchọcha Ome nchọcha tụrụ aro ndị a: a. Iwubesi Otu Ndị A Họpụtara maka Nhazi Mkpụrụokwu ike O kwesịrị na a ga-atụte otu ndị a: „The Igbo Standardization Committee (ISC), The Society for Promoting Igbo language and Culture (SPILC) na Igbo language Studies Association (ISA) nye ha nkwado zuru oke mgbe niile. Otu ndị a aghaghị iwepụ ndọrọ ndọrọ onye bụ isi na onye bụ ọdụ n‟ụsọ ma jiri uchu bagide ọrụ ha. Ọ bụrụ na a haziri otu ndị a etu a tụrụ anya, ọ bụ ha ka ọ dịịrị ịhụ na e nyochara okwu ọ bụla tupu ọ pụta n‟ọkọwa okwu. A ga-agbakwa mbọ hụ na ndị mebere otu ndị a ga-abụ ndị ọka mmụta sitere na ngalaba amụmamụ ụtọasụsụ dị iche iche. b. Iwube Ọba Akwụkwọ Nrụgara Aka Otu ndị ahụ a kpọrọ aha n‟elu kwesịri iwube ọba akwụkwọ ebe a ga na-edebe akwụkwọ niile ndị metụtara okwu ọhụrụ Igbo niile, nchọcha ọhụrụ niile e mere na mkpụrụ okwu Igbo, ma jọnal niile e nwere mmepụta okwu ọhụrụ Igbo na ha. ch. Ịzụpụta Ndị Ọka Mmụta Mmepụta Okwu Ọhụrụ Mkpụrụokwu abụghị ihe onye si ebe o si o buru otu ihe makapụta kpọọ ya mkpụrụokwu. A na-agara mmepụta mkpụrụokwu ọzụzụ n‟ụlọ akwụkwọ dị elu. Ọ bụ naanị mgbe mmadụ gabigachaara ọzụzụ ahụ ka o tozuru ịbụ ọka na mmepụta mkpụrụokwu ọhụrụ. A ga-agba mbọ hụ na ndị ụlọ mgbasa ozi so na ndị na-ama ọkwa natara ọzụzụ a tupu ha etozie imebe mkpụrụokwu. d. Gọọment Nwere Oke na Ọrụ A ga-ahụ na edebeghị gọọment n‟akụkụ n‟ihe gbasara ọrụ mmepụta mkpụrụokwu ọhụrụ. O kwesịrị na otu a kpọrọ „The Nigerian Educational Research Council‟ ga na-ahazi ọgbakọ nkụzi maka ime ka ndị na-emepụta mkpụrụokwu mata ebe a kwụ n‟ije ozi a. Jirikwa ohere ahụ mepụta mkpụrụokwu ọhụrụ ndị metụtara ngalaba ụtọasụsụ dị iche iche. e. A gaghị Agbahapụ ndị Ụlọ Mgbasa Ozi Ndị ọka mmụta na-ahụ maka mmepụta mkpụrụokwu na ntụgharị kwesịri na ha na ndị ọrụ mgbasa ozi kwesịrị ị na-arụkọ ọrụ ọnụ. Nke a bụ iji gbazieere ha ụzọ nke ọma, maka na ọ bụrụ na a hapụ ha, ha emepụta okwu etu sọrọ ha gbasaara ya ọha na Daniel Ihunanya Ilechukwu & Christian E. C. Ọgwụdịle 141 eze, maka na ọ bụ ndị mgbasa ozi bụ ndị ka agbasa okwu e mepụtara ọhụrụ ebe niile. Nchịkọtana Mmechi Dị ka o si kwụrụ, ederede a agbaala mbọ ịkọwa ihe bụ mmepụta mkpụrụokwu na ihe bụ ntụgharị. Omepụta mkpụrụokwu ọhụrụ na-akwado ome ntụgharị site n‟imepụtara ya okwu ọhụrụ ka ọ ga-abụ mgbe ọ bụla ome ntụgharị bịakwutere ya, o nyere ya aka. Ọ bụrụ na e debeghị okwu ọhụrụ n‟ebe kwesịrị ya, ị mara na ọ gaghị eru ome ntụgharị aka nke ga-eme ka e nwee mmejọ n‟ọrụ ntụgharị ya. Inweta otu mkpụrụokwu a ga-eji kọwa ihe bụkwa otu mkpụrụokwu n‟asụsụọzọ ka mma karịa iji ahịrịokwu atụgharị otu mkpụrụokwu. E nwebeghị otu kwụ chịm chịm maka nhazi asụsụ Igbo na mkpụrụokwu ya bụ nnukwu nsogbu asụsụ Igbo na-agabiga ugbu a. Nsogbu ndị ọzọ bụ e nweghị ọba akwụkwọ, e nweghị ọkọwa okwu asụsụ Igbo, e nweghị ndị a zụrụ nke ọma, wdg. Ọ bụrụ na e nwee ihe ndị ahụ, ọ ga-eme ka asụsụ Igbo too na mkpụrụokwu Edensibịa Ajaị, K. (1985). Education Policy Research in Nigeria: The State of Art Position, NERC Conference. Ajụnwa, E. (2014). A Textbook of Translation. Nigeria: Enovic Ltd. Anyaehie, E.O. (1997). Studies in Terminology. Okigwe: Fasmen Communications. Cartford, J.C. (1965). Linguistic Theory of Translation. London:Oxford university press. Dubuc, R. (1978). Manuel Pratique de Terminology, Quebec Linguatech. Mbah, B.M. et al (2013). Igbo Adị. Enugu: University of Nigeria Press. Nida, E. (1964). Towards a Science of translation. Leiden: linguatech. Nnaji, H.I. (1995). Modern English/Igbo Dictionary. Onitsha: Gonaj Books. Nwanjọkụ, A. C. (1998). Terminology Research and Standardization. The Case of Igbo in Contemporary Scientific Age. Fasmen Educational and research Publications. Nwosu, U. (2010). English Igbo Translation of Common. Benin:Mindex Publishing Comp. Okeke, V.O. (2000). The terminology Development in Nigerian languages. Forth Annual Workshop on Terminolgial Development in nigerian languages NINLAN ABA. Mmebe na Ntụghari Mkpụrụokwu Bekee N’igbo: Nsogbu na Ụsa Nye Ya 142 Oli, J.M., Nwozuzu, G.I. & Mba, B.M. (2013). English Igbo Medical Dictionary. Enugu: University of Nigeria Press. SPILC Ọkaasụsụ Igbo (1985). Igbo Metalanguage Language recommendations of Igbo Standardization Committee. Varsity Industrial Press. Rey A. (1979). La Terminologie, Non et Notion. Paris Presse Universitaire de France. Mbah, B.M. et al (2013). Igbo Adị . Enugu: University of Nigeria Press