



































IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri 
metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 

 

 
By 

 
 Pauline Chinasa Nwizu 

School of General Studies 
Alvan Ikoku Federal University of Education 

Owerri. 

 
 Vivian, C. Chibundu 

School of General Studies 
Alvan Ikoku Federal University of Education 

Owerri. 

 
Ụmị  
Nchọcha a na-eleba anya n’ụfọdụ ihe nramaahụ di n’echimechi ọzọ dị ka o si metụta mmekọrịta 
mmadụ, omenala nakwa akụnaụba n’oge ugbu a. Nchọcha a kpợmkwem na-akọwa usoro dị iche 
iche e si echi ọzọ n’Ebenatợ Ọlụ Gedegwum, nke dị n’ochichi ime obodo Ọlụ. E lebakwara anya 
n’uru na nsọ dị n’echimechi ọzọ, kọwakwaa ugwu na nsợpụrụ a na-enye onye chiri ọzọ n’ala 
Ebenatọ-Ọlụ Gedegwum. Usoro nnweta njantụle (data) bụ site n’ajụjụ ọnụ a gbara ndị nze anọ 
nakwa ihe nlereanya ebe a na-echi ọzọ.  Atụtụ e jiri mee nchọcha bụ atụtụ Marxist nke Karl 
Marx na Friedrich Engels tụpụtara n’ime afọ cenchuri iri na itolu, nke kọwara etu ego si achi 
ụwa. Site na ntọsasi njantule enwetagasiri, a chọpụtara na ọzọ bu nnukwu echichi e ji ama onye 
nwere akụnaụba, ugwu na nsopụrụ n’ala Igbo. A chọpụtakwara na oke mmefu akụnaụba di 
n’echichi ọzọ, ebe a na-esi, anu nakwa nnukwu isi ego a na-akwu ndi ọzọ ga-ekeri, oke iwu na 
nsợ dị iche iche dikwa na ya, okpukpere chi ọlọrọọhụrụ socha n’ihe na-achịrị echimeche ọzọ 
akamgba n’Ebenatọ- Ọlụ. A tụrụ elo ka ewebilata oke mmemme na oriri a na-akpợ ugboro 
ugboro na usoro di iche iche di n’echimechi ọzọ nke na-ewe ọtụtụ akụnaụba onye nwere mmasị 
ichi ọzọ. A tụkwara elo ka e wepụga ụfợdụ nsợ ndị megidere ụka na mmekọrịta mmadụ na ibe ya 
n’echimechi ọzọ. E mee nke a, ọtụtụ ihe nramaahu di n’echimechi ọzọ ga-ebelata, ọtụtụ mmadụ 
ga-enwekwa mmasị n’ichi ọzọ. Nke a ga-akwalite ợnợdụ obibi ndu, ezi mmekọrịta nakwa 
mbawanye akụnaụba nke mba ụwa n’oge ugbu a. 
 

Ọkpụrụkpụ okwu: Ọzợ, Omenala, akamgba. 

 

 

 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 47



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Abstract 

This research looks into the challenges of ọzọ title as it affects the relationship between 

individuals, culture and socio-economic disposition of the citizens in the society. Specifically the 

paper explains the meaning of ọzọ, stages of ọzọ title taking in Ebenato Orlu Gedegwum in Orlu 

Local Government Area of Imo State. It also examines the benefits and privileges enjoyed by the 

ọzọ title holders in Orlu Gedegwum. Data for the analysis were collected through oral interviews 

and researchers observation. The analysis was guided by Marxist theory, propounded by Karl 

Marx and Friedrich Engels in the 19th century which explains how people own and control the 

distribution of wealth in the society. From the analysis, it was observed that ọzọ title is a 

prestigious and highly recognized title in Igbo land. It was also observed that a lot of wealth is 

wasted on the initiation into ọzọ title due to long process of ceremonies which involve cooking,  

drinking and paying heavy amount of money to be shared by old members, excessive laws and 

rites are given and to be observed by the ọzọ title holders. It was also discovered that modern 

ways of worship (Christianity) also affects the membership into the ọzọ title in Ebenato Orlu. 

Finally, it was suggested that excessive merriment, cooking, eating and drinking characterized 

with ọzọ title be reduced, it was also suggested that some laws affecting the members of the ọzọ 

title be modernised to enable young men who are willing to join do so. This will promote 

relationship, peace and harmony in the state, thereby bringing unity to the whole world. 

Key words: ọzọ, culture, challenge. 

  

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 48



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Mmalite 

Ọzọ bụ otu n’ime echichi e nwere n’ala Igbo nke ndi na-echi ya bụ ợgaranya, nwere akụ- 

naụba, onye nwere ọnụ nakwa onye ndụ ya kwụ ọtọ. Ọzọ bụ otu na-akwalite omenala, ọchịchị, 

ibi ezi ndụ nakwa akụnaụba nke obodo ndị chiri ya. Ọzọ bụ ihe ukwu. Ya mere o jiri dọrọ ugwu 

na nsọpụrụ karia echichi ndị ọzọ.  

Ọ bụ echichi ndị chiri ya ji egosi nkarị na inwe oke ego n’ala Igbo. Ya mere ndị Igbo ji 

ekwu si ihe nwa jiri kara ibe ya bụ ọzọ. (Nze Okereke 2023) Ọ bụghị naanị inwe ego, onye na 

echi ọzọ ga-enwe mmụọ oriri na inyere ndị mmadụ aka maka na mmemme na oriri dị n’ichi ọzọ 

dị ọtụtụ. Ọ bụ nannị diala na onye ndụ ya kpakọrọ ọnụ na-echi ọzọ, ya mere e jikwa asị na ofeke 

lịa ọzọ ya chienu. Nke a pụtara na ofeke anaghị echi ọzọ.(Nze Uzoukwu 2023) 

N’oge gboo, a hụrụ echichi ọzọ dị ka echichi di nsọ nke onye a na-enyo enyo n’obodo 

agaghị echi ya ọzọ, onye na-erijughị afọ anaghị echi ya ọzọ maka mmefu ego dị na ya buru ibu. 

Nze Ụzọukwu, n’ajụjụ ọnụ a gbara ya kọwara na a na-enyocha onye chọrọ ichi ọzọ nke ọma tupu 

anabata ya. Ọzọ dịka anyi si kwuo na mbụ so n’otu na-akwalite omenala, ợchịchị, 

ikpenkwumuọtọ, akụnaụba nke obodo nakwa ibi ezi ndụ n’oge gboo, mana etu ọ di taa, echichi 

ọzọ na-alazi azụ, omenala na ibi ezi ndụ kọziri ọkọchi n’ime obodo anyị. Ihe kpatara ọnọdu di 

etu a ka ederede a na-eleba anya na ya, iji chọpụta ihe nramaahụ na ndọla azụ di n’ebe echichi 

ọzọ nọ n’oge ugbu a, ka e nwee ike wepụ aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ. 

 
 Ọzọ bụ echichi kachasi echichi niile n’ala Igbo. Ya mere e ji enye ndị chiri ya ugwu na nsọpụrụ 

pụrụ iche n’ala Igbo. Ọzọ bụ ihe ukwu dịka Nze Simon Ụzọukwu kwupụtara, anaghị ahapụ ebe a 

na-echi ọzọ gawa ebe a na-arụ agwụ. Onye ọ bụla chiri ọzọ, abụrụla onye nze, ha na-ezere ihe 

ọjọọ. Nze anaghị ekwo ekwo. Nze bu  ọjị ma ọ bụ ụdara, ọ bụghị n’ala niile ka ọ na-epu. Onye 

ọbụla ga-echi ọzọ ga-abụrịrị onye obodo na-enye nsọpụrụ na ugwu, dịka onye adịghị enyo enyo, 

onye kpatara ego, nwekwa ike ịchikọta ezinaụlọ ya nke ọma. Nwata biwe ndu ọjọọ, e chie ya 

ọzọ, maka na a tụrụ anya na ndi e chiri ọzọ na-ebi ezi ndụ kwesiri nṅomi. Onye nwere ike idebe 

iwu nze, ga-enwe ike idebe iwu Chukwu maka na iwu ndi nze di ọtụtụ. Nwata anaghị ekpu okpu 

nze n’ihu nna ya. Ọ bụrụ onye na-anọghị n’ụlọ, o nwere ike ikpu okpu nze ebe o bi mana ọ lọta 

n’obodo nna ya, o kpupu ya. Ndi nze na-akụrụ n’aka ugboro atọ ma ha na-ekele onwe ha. Ha na 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 49



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

akụrụ, ha na-ekwu ‘Onye nze karoo…zeroo, Onye nze zeroo…Karoo. Nwata bụ nze agaghịkwa 

akụrụ atọ n’ihu nna ya.   

Omenala: 

 Omenala bụ etu agbụrụ si ebi ndụ ma o bụ akpa agwa nke onye ọ bụla jiri mara ha. (Nwizu 

2014) na nkowa ha, omenala gụnyere etu obodo ma ọ bụ agbụrụ si efe ofufe, ejiji ha, alụmalụ, 

egwu, ikwa ozu, igba alụkwaghim, izụ ahia, erimeri, nkwenye, echichi, akaọrụ, agụmagụ dgz. 

N’ụzọ di nkenke, ọzọ nke bu isi dọkpụ n’ederede a bụ omenala Igbo nke batara n’ọnọdu ngalaba 

echichi/echimechi. 

Akamgba: 

 Akamgba bụ ọdachi ma ọ bụ ihe mkpobiụkwụ nyere agamnihu njem ma ọ bụ ihe. N’ikọwa 

akamgba n’ụzo ọzọ, e nwere ike isi na ọ bụ ihe nramaahụ n’ebe ihe ụtọ di, ọnọdụ ndọla azụ n’iga 

n’ihu. Akamgba a na-ekwu maka ya ebe a bụ ọnọdụ ndi ahụ na-eme ka echimechi ọzọ na-ala 

azụ. Mgba bụ inwale ike mba abụọ ka a mara nke bụ oke. Akamgba bụkwazi imanye mmadụ aka 

n’anya, iji kwatuo onye ahụ n’aha mmeri.  

  

Ebe nchọcha   

E mere nchọcha a n’Ọlụ Gedegwum. Ọlụ Gedegwum nọ n’okpuru ọchịchị ime obodo Ọlụ. Dịka 

Nze Simon Ụzọkwu siri kwuo, Ọkwaraugwuele bụ nna Ọlụ. Ọ lụrụ ụmụnwaanyị abụọ. Nke mbụ 

mụtara ụmụ anọ: 

1) Eluama 

2) Ụmụdiatọ 

3) Ụmụire 

4) Ndịowere. 

Nwanyị nke abụọ mụtara ụmụ atọ ndị a: 

1) Ụmụọkwara 

2) Ụmụafọr  

3) Ụmụdihe.  

Ọnụmara atọ a bụ ndị mebere Ebenatọ 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 50



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Site n’Ebenatọ ka e si kewapụta Ọnụmara ndị a: Ụmụeleke, Ụmụndule, Okpuruogwe, 
Ishigwenne, Okwu na Duruezeugwu. Ebe nchọcha a gbadoro ụkwụ bụ n’Ebenatọ dị n’ Ọlụ 
Gedegwum.   
 

 

 

Usoro e si echi ọzọ n’Ebenatợ Ọlụ. 

Ọzọ bụ ihe ụlọ di ka Nze Uzoukwu siri kwuo. A na-esi n’ụlọ mara mma pụwa ama.  Nke 

a pụtara na a na-esi n’ogbe obodo onye ahụ na-echi ọzọ siri pụta ebido echichi ọzọ. 

Nze Nnanyere Ugo Cypria Okereke, kọwara na ọ dị ụzọ abụọ e si echi ọzọ: 

1. Igbukwa agada 

2. Ichi ọzọ dịka omenala echichi ọzọ siri di 

Igbukwa adada  

 Ịgbụkwa agada bụ ọkpara iweghara mkpara nna ya dika onye nze mgbe e lichara nna ya. 

Onye nna ya bụ nze nwụo, nwa ya nwoke ga-agwa ndi nze obodo ha na ya ga-eweghara ọkwa 

nna ya dịka onye nze. Ọ bụ ọnọdụ a ka a na-akpọ igbukwa agada. Ozugbo elichara onye nze 

nwụrụ anwụ, a ga-enye nwa ya nwoke otu afọ iji mee mmemme igbukwa agada. Nke a pụtara na 

onye ahụ chọrọ ịnọchi ọnọdụ nna ya. Ọ bụrụ na o meghi ya otu afọ agachaa, a na- asị na ọzọ nna 

ya adanyela n’ọbụ/olu nke pụtara na o fuole. Nke a bụ akụ ịla n’iyi n’ihi oge ọ bụla o chọrọ ichi 

ọzọ na ndụ ya, o ga-ebido n’isi mewe mmemme di n’ichi ọzọ nke na-ewe ọtụtụ ego. Igbukwa 

Agada na nkenke bụ ọkpụkpọ ọkụ onye nna ya bụ nze na-akpọ ndị nze ozugbo o lichara nna ya, 

iji kọwaa ebumnuche ya n’ịga n’ihu ịbụ otu n’ime ndị otu nze nna ya bu. Onye ahụ gbuoro ndị 

nze ewu (igbunye ewu) a mata na o kwele nkwa imezu ihe ndị ọzọ eji egbukwa agada nke bụzi 

ọkara ọkara n’ihe ndi a na-eji echi ọzọ. A ga-enye ya otu afọ imezu ihe igbukwa agada a n’ihi 

onye liri ozu ọzọ anaghị awalite nze n’ike. 

 

Ichi ọzọ dịka omenala echichi Ọzọ siri dị 

 
Agba nke mbụ: Ikwupụta ebunuche 

 Onye chọrọ ichi ọzọ ga-ebu ụzọ gakwuru onye isi okenye bụ nze n’ogbe ya, kọọrọ ya 

ebumuche ya. 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 51



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Ihe ndị ọ ga-eji aga ije ahụ gụnyere 

1. Ose ọjị asatọ 

2. Ọjị asatọ 

3. Mmanya nkwụ  

Mgbe ọ kọchara onye isi nze ogbe ya ebumuche ya, onye nze ga-asị ya lawa na ọ ga-akpọ ya 

oku. 

Agba nke abụọ: Ịkpọ ndị nze oku 

Onye isi ndi Nze ogbe ahụ ga-akpọ ndi nze ibe ya, wee kọọrọ ha ihe onye di etu a kwuru. 

Onye nze a, ga-ewerekwa ụfọdụ ihe onyinye onye ahụ jiri bịa na mbụ cheere ndị nze ibe ya ọjị. 

Ndị nze ga-ebido jụwa ase banyere onye ahụ chọrọ ichi ọzọ. Ịjụ ase a nwere ike iwe ihe 

dịka otu ọnwa ma ọ bụ otu afọ. Ọ bụrụ ma nchọcha ha mere ma ọ bụ ase ha jụrụ gara nke ọma, 

onye isi nze ga-akpọzi onye ahụ na-achọ ichi ọzọ oku iji kọọrọ ya ihe bụ mkpebi ndị nze. 

 

Agba nke atọ: Ịgba ajụjụ ọnụ 

Ọ bụrụ ma ndị nze hụta na onye ahụ bịara maka ịnabata ya n’echiche ọzọ bụ ezigbo mmadụ, o 

nweghị ihe ọjọọ ha nyopụtara n’ebe ọ nọ, ndị nze ga-akpọ ya jụkwa ya ajụjụ ọnụ iji mata ma obi 

ọ kara ya ịga n’ihu ichi echichi ahụ. Dịka Nze Ugochinyere Okere kwụpara, ọ bụ ụbọchị 

ekeukwu ka a na-eme ihe ọ bụla gbasara echichi ọzọ 

Ihe ndị onye ahụ ga-eji abịa ije a gụnyere  

1. Ose ọji asatọ 

2. Ọji asatọ 

3. Ite mmanya nkwụ asatọ 

Ha ga-agwazi ya na site na nchọcha ha mere, ya gaa n’ihu kwado maka echichi ọzọ. Onye ahụ 

n’onwe ya ga-enwe obi anụri n’ihi ọ bụ ịgosipụta na arịrịọ ya ịbụ onye nze, na a nabatara ya, 

mana ọ bụrụ na a chọpụtara ihe adịghị mma, agaghị akpọ ya oku. 

 

Agba nke anọ: Igbunye ewu 

Nze Simon Ụzọukwu mekwara ka a mata n’agba nke a, onye isi ndi nze ga-akpọ ndị nze oku 

n’ụlọ onye ahụ chọrọ ichi echimechi ọzọ. Ihe ndị ọ ga-ewpụta, iji gọọ ha ọji gụnyere: 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 52



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

a. Otu ewu nke ndị nze tụrụ aka, ka ọ ga-azụ (oje ozi ndị nze ga-eme nke a) 

b. Ose ọji asatọ 

c. Ọji asatọ 

d. Ite mmanya nkwụ asatọ 

e. Ji asatọ 

Mgbe ụfọdụ,  ha nwere ike mee ihe ndị a n’ego. Ọ bụrụ na anaghị eme ya n’ego, ndị nze na-eji 

aka ha gaa ahịa, tụọ ewu ha chọrọ onye ahụ ga-azụta aka. Ọ bụ nke a ka ana-akpọ Igbunye ewu.  

 Ndị Nze ga-egbu ewu ahụ kee onwe ha, nakwa ihe ndị ọzọ o wepụtaara ha, Onye isi nze 

ga-agọzi ya ma gọkwaara ya ọfọ gbasara ije a ọ bidoro, na ọ ga ejeru ya n’isi n’ihi ụfọdụ mmadụ 

nwere ike nọrọ na echichi ọzọ nwụọ, agaghị ekwukwa na onye ahụ bụ nze.  

 

Agba nke ise: Isi ego 

 N’oge a, onye na-echi ọzọ ga-enye ndị Nze otu narị naịra ma ọ bụ karịa. Ndị nze niile nọ 

n’ogbe ya ga-eketa oke n’ime ego a. Ọ na-abụ ụbọchị Ekeukwu dika Nze Ugochinyere Okere 

kọwapụtara ka a na-eme emume echichi ọzọ nke a na-akpọ ịkwụ ishi ego.  

Ihe ọ ga-eji bịa ije a gụnyere  

1. Ite mmanya nkwụ asatọ 

2. Ose ọjị asatọ 

3. Ji asatọ 

4. Ọjị asatọ 

Ihe nze na-aga elu elu ọ naghị adatu ala. Ọ ga-ebunye ndị nze ahụ mmanye n’isi n’isi, 

keere ha ego ahụ (otu naira ahụ) ọ jiri bịa. Ọ bụrụ na ndị nze ahụ nọ n’ogbe ahụ lawa, onye ahụ 

na-achọ ichi ọzọ ga-enye ha naịra iri iri n’otu n’otu. Nke a bụ maka ndị nze si ogbe onye na-echi 

ọzọ. (Ndị nze ụlọ)  

 

Agba nke isii: Ibu mmanye n’ogbe ndị ọzọ 

Onye na-achọ ichi Ọzọ ga-ebutere ndị ọnụmara ọzọ dịkwa n’ime obodo mmanye iji mee 

ka ha mata na ya chọrọ iso bụrụ otu n’ime ha. Dịka Nze Cyprian Ugochukwunyere kọwapụtara, 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 53



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

e nwere ọnụmara atọ na Ebenatọ, ọ bụ ọnụmara atọ a ka onye ahụ ga-aga bugara mmanya n’isi 

n’isi. 

Ihe ndị ọ ga-eji gaa ije a gụnyere 

a. Ọji asatọ 

b. Ose ọji asatọ 

c. Ji asatọ 

d. Ite mmanya nkwụ na ite mmanya ngwọ 

e. Ego (N10,000) 

f. Otu igbe mọltụ, Otu igbe bịa, Otu igbe stawụtụ 

Ndị Nze ga-anara onyinye ndị a, ma gozie ya. 

 

Agba nke asaa: Ịnyụ mmamịrị n’Obi/ ịgba mmanya ozuzugbo 

Nze Simon Uzoukwu kọwara na onye chọrọ ichi Ọzọ ga-akwado nke ọma n’emume ịnyụ 

mamịrị n’obi. Ịnyụ mamiri n’obi bụ ụbọchi a na-agbara ọnụmara niile di n’Ọlụ mmanya maka 

echichi Ọzọ.  Ọ na-abụ nnukwu emume nke na-adịkwa n’ụbọchi eke ukwu dịka omenala ndị nze 

di n’Ọlụ siri hazie ya. A na-adakwa abali tupu e chiwe ọzọ. Oge a ka a ga-eji gụsịara ya iwu na 

nsọ di n’echichi ọzọ, oriri na ọṅụṅụ na-arịkwa ibe ya elu. 

Ihe onye na-echi Ọzọ ga-eji abịa ije a gụnyere: 

a. Ji iri na isii 

b. Ose iri na isii 

c. Ọji iri na isii 

d. Ite mmanya nkwụ iri na isii 

e. Ite mmanya ngwọ iri na isii 

f. Otu Nde naịra (#1,000,000) 

g. Otu ehi  

N’ụbọchi ahụ ka a ga-ekpube ya okpu Ọzọ, bụrụkwa ụbọchi a na-enye ya aha Ọzọ ya; ọ 

ga-egbukwa otu ehi ọ ga-enye ndị nze niile bịara ebe ahụ. O ga-enyekwa ha otu ehi na ndụ ha ga-

eji aka ha esi, gbukwa ehi nke ọ ga-eji akwọ ndị ọbia ga-abịa n’ụbọchi ahụ. Ihe oriri na ihe 

ọṅụṅụ dị iche iche ga-adị. Ndị nze niile bịara ebe ahụ ga-eji ọdụ nze ha abịa, ọ bụ ihe ha ga-eji 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 54



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

fụọ opi mgbe oge nke ahụ ruo. Tupu e kpuwe onye nze okpu, onye isi ndi nze ga-etinye ya okpu 

n’isi, a gụọ otu, a tụkwasị ya n’ubu, a gụọ, ruo mgbe a gụruru iteghete, e kpuwezie ya okpu nze 

ya. Okpu nze pụtara na ọ ga-akaruo zeruo. Ngwa njike ndi ọzọ onye chiri ọzọ na-eyi bụ esuru 

nze, nke pụtara ezi ndụ na eziokwu, akpa nze bụkwa ebe ọ ga na-afọnye ihe ọ bụla ọ kpatara, 

akụfe nze- o ji akụfu ihe ọjọọ, werekwa ya ekute ihe ọma, ọdụ nze nke onye nze ọ bụla kwesiri 

inwe.    

 

Agba nke asatọ-Ikpofu ntụ 

Mgbe onye ahụ mechara emume ịnyụ mmamiri, ndị nze ga-ezukọ n’ekeukwu ọzọ maka 

emume nke a kpọrọ ikwofu ntụ. Dịka Nze Simon Uzoukwu kọwara, ọ bụ oge onye ahụ e chiri 

Ọzọ ga-akpọku ndị ọnụmara nke ya, nyekwa ha ụdị ihe ndị ahụ o bunyere ndị ọnụmara ndị ọzọ. 

Ihe ndị a ka ọ ga-ebunye ha. 

a) Otu oke ewu 

b. Otu ite mmanya ngwọ/nkwụ  

c. Ji asatọ  

d. Ọji asatọ  

e. Ose asatọ 

Ọ ga-enye ndị Nze obodo ya ihe niile ọ nyere ndị nze onodo ndị Ọzọ dika Nze Cypria 

Nnanyereugo Okere kwupụtara. Ọ ga-enyekwa ndị obodo ya ahụ narị puku naịra abụọ 

(#200,000) nke ndị nze niile ga-eketa oke na ya. Nke a mere e ji ekwu na onye chiri ọzọ bụ o ji 

akụ bụrụ okenye n’ihi ọ kezuola akụ na ụba ya. 

Mgbe ha mechara ihe ndị a dịka omenala ha si di, a ga- agba egbe, egwu na aṅụrị na-

ejupụta ebe niile iji gosi na onye ahụ emezuola ihe niile di na echichi Ọzọ, onye ahụ abụrụla ọ ji 

akụ bụrụ okenye. 

 

Nchọcha e merela Banyere isiokwu   

 E meele ọtụtụ nchọcha n’isiokwu a bụ ọzọ n’ala Igbo n’ụzọ dị iche iche. Odigbo (2023) 

mere nchọcha nke isiokwu ya bụ ‘ọzọ ihe ngosi akụnanụba n’ala Igbo’. Ọ hụtara ọzọ dịka 

echichi ndị gbasiri ike n’ọrụ, kpata ego n’obodo, bịa jirikwa akụnaụba ha were kwado ndị obodo 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 55



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

n’ụzọ dị iche iche. Na nchikọta nchọcha ya, ọ chọpụtara na ọzọ abụghị ihe e ji amata onye nwere 

akụnaụba. Mmadu nwere ike ịkwụrụ onye ọzọ ụgwọ ka e echie ya ọzọ. Ndịiche nchọcha Odigbo 

na nke a bụ, ebe Odigbo na-achọ ịma ma ọzọ ọ bụ ihe nchọta akụnaụba, nchọcha nke a na-achọ 

ịma ihe ndị chere echichi ọzọ akamgba n’oge ugbu a. 

 
Ntụlegharị Edemede 

Ọtụtụ ndị odee edeela edemede banyere ọzọ na ọtụtụ ihe ndị gbara ya gburu gburu. 

Ahamefule (2020) kwuru na ọzọ bụ otu n’ime echichi kpụ ọkụ n’ọnụ n’ala Igbo nke na-akwado 

mmekọrịta na mwụlite akụnaụba nke ndị otu ya. Uru na ihe nrite si na ya apụta na-adigide, site 

na nna fere na nwa. 

Mmemme dị n’ichi ọzọ na-efu oke ego, nke na onye chọrọ ichi ọzọ na-emefu ọtụtụ ego. 

Ego ndị a dịka ego a tụnyere n’ụlọ nchekwa aku ebe ọ ga-emechaa mụta nwa. Nke a mere ka ego 

onye ọhụrụ kwụrụ ghara ịbụ ihe ntufu maka na ọ ga-eketakwa oke na nke ndị ọhụrụ ga-abata 

n’otu ọzọ. 

Ndị chiri ọzọ na-enweta ego site n’ego onye na-abata ọhụrụ kwụrụ. Ego a onye ọhụrụ 

kwụrụ ka ndị ochie ga-ekeri. Ọ bụ site n’ụzọ dị etua ka ndị ọzọ si enweta ego ha mefuru oge ha 

na-abata n’otu ndị ọzọ. (Nze Uzoukwu) 

Anikwe (2019) kọwapụtara na tupu e  chie mmadụ ozo n’oge gboo,  ọ ga-abụriri onye 

nwere akụnaụba. ọ bụ ọba ji mmadụ nwere, na nkwụ na ụkwa ya ka e ji atụle akụnaụba ya. Ma 

n’oge ugbu a mmepe obodo batara, ọ bụghịzị sọsọ ihe si n’ala ka eji atụle akụnaụba mmadụ. Nke 

a na akwado ilu ndị Igbo na “ihe nwa jiri kara ibe ya bụ ọzọ’ maka na onye chiri ọzọ bụ 

ọgaranya. 

Odigbo (2023) kọwara Ntephe (1995) siri na onye chọrọ ichi ọzọ ga-enweju akụnaụba 

afọ n’onwe ya, bịa nwekwaa nke ọ ga-eji azụ ndị obodo ya. Ọnọdụ dị etu a bụ ahụghị ebụle ma 

elighị dike n’echichi ọzọ. 

Ọdigbo (2012) kwukwara na ọzọ so n’echichi kachasị ndị ọzọ n’ala Igbo. Anaghị eji ọnụ 

akụrụ nze, anaghịkwa esi na mkposhi azụ ụlọ abata na nze. Ọdigbo kọwara na ọ dị ọtụtụ ihe a 

na-eme tupu anabata onye chọrọ ichi nze. Ọ kwuru na mmadụ anaghị ewepụta onwe ya, na ya 

chọrọ ichi ọzọ, ndị obodo onye ahụ ga-aka ama onye zuru ezu ma wepụta onye ahụ maka echichi 

ọzọ ma ọ bụrụ na onye ahụ zuo oke na echimechi ọzọ. 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 56



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Onye chọrọ ichi ọzọ ga-akpọ ndị obodo ya oriri. O ga-abịakwa kpọ ndị ọzọ ndị ọzọ oriri 

ebe ọ di ukwuu, bịa nyekwaa ọtụtụ ihe ha ga-eji ala. Nke a bụ ụzọ ndị chiri ọzọ si enwetaghachi 

ihe ha mefuru oge ha na-echi ọzọ. 

Ngwu (2011) kwukwara na usoro e si echi ọzọ n’Ukehe dịkwa ọtụtụ ma bụrụ ụsọrọ a 

kọwaburu na mbụ. 

 

Iwu/nsọ dị n’ichi ọzọ 

1. Onye ọ bụla echiri ọzọ na-abụ ezigbo mmadụ, anaghị enyo ndụ onye ọzọ/nze enyo. 

2. Onye nze ọ bụla nwere ike inwe karịa otu nwanyị ma sọ otu n’ime ụmụnwanyị ndị a ga-

abụ Lọlọ ya. (Lọlọ e jiri chi ọzọ) 

3. Ndị chiri ọzọ adịghị eri nri n’ọha, a na-akpọba ha n’ime ụlọ were nye ha ihe oriri. 

4. Onye nze adịghị agba asụ ebe a na-eli onye nze ibe ya, ọ bụrụgodi na ozu onye nze ahụ 

na-esi nsi. 

5. Ndị nze bụ ndị eji ikwu eziokwu mara n’ihi na onye nze ọ bụla kpere ikpe ọjọọ, ndị 

mmụọ na-akụgbu ya ozugbo. Onye nze kwesiri ya bie ikpe; o buru oche ya laa. Nke a 

pụtara na ọ gaghị ele anya ọjị ma ọ bụ ego, ma ọ bụghị etu a, ọ tọ n’ọgbọ ikpe. 

6. Onye chiri ọzọ adịghị eri nri nwanyị nọ na nsọ siri. Nke a mere ndị nze na nwunye ha 

adịghị ebiko n’otu ụlọ. 

7.    Nwata anaghị ekpu okpu nze n’ihu nna ya. Ọ bụrụ onye na-anọghị n’ụlọ, o nwere ike 

ikpu okpu nze ebe o bi mana ọ lọta n’obodo nna ya, o kpupu ya. 

8.      Nwata bụ nze agaghịkwa akụrụ atọ n’ihu nna ya.   

 

Uru echichi ọzọ bara 

1. A na-akwanyere ndị nze ugwu nke ukwu n’ihi ọnọdụ ha n’obodo dịka Nze Cyprin 

Nnanyereugo siri kọwaa. 

2. N’obodo Ọlụ, ọ bụ ndị chiri ọzọ na-ebi ikpe n’ihi e weere ha (ndị chiri ọzọ) dịka ndị na-

ekwu eziokwu. 

3. Ichi ọzọ bụ ụzọ nchekwa akụ 

4. Ọ na-enye ndị chiri ọzọ akụnaụba site n’ikete oke n’ihe ndị na-abata ọhụrụ na-eweta. 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 57



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

5. E ji ichi ọzọ eriju afọ. 

6. A na-eji ya amata ezigbo mmadụ na onye na-ekwu eziokwu maka na onye ndụ ya di 

ghara ghara anaghị echi ya ọzọ. 

7. A na-eji ndị chiri ọzọ edozi okwu na ụka n’ihi a maara ha ka ndị ikpe nkwumụọtọ. 

8. A na-enye ndị chiri ọzọ ugwu na nsopụrụ pụrụ iche n’obodo. 

 

Ekele Ndị Ọzọ 

1. Ndị nze anaghị ekwe n’aka, ka ma ha na-akụchara n’aka ugboro atọ. 

2.  Ndi nze na-akụrụ n’aka ugboro atọ ka ha na-ekele onwe ha. Ha na-akụrụ, ha na-ekwu.  

 Onye nze: Onye nze karuooooo! 

 Nzaghachi: Zeruo oooo! 

 Onye nze: Onye nze zeruo ooo! 

 Nzaghachi: Karuoooo! 

Onye nze: Onye nze karuoooo! 

Nzaghachi: Zeruooooo. 

 Nwata bụ nze agaghịkwa akụrụ atọ n’ihu nna ya. 

 

Ọnwụ onye nze   

Dịka Nze Simon Uzoukwu kwuru, onye nze enweghị ike ịgba asụ ebe a na eli onye nze 

ibe ya, ọ bụladi na ozu ya na-esi isi. Anaghị ebe akwa ebe onye nze nwụrụ n’ihi onye nze anaghi 

anwụ anwụ, a na- asị na ọ gara n’ụfọ. A na-elikarị ozu onye nze ụbọchi eke ukwu dị ka e siri 

chie ya ọzọ ụbọchi eke ukwu ma ọ bụrụ na ha emesia mmeme niile dịka iwu ndi nze Ọlụ siri dị. 

Anaghị eli onye chiri ọzọ mgbe a na-eme oriri ọ bụla dịka Mgboọnwanu, iri ji nakwa 

ịgba ọfala. Agada onye ọzọ dị n’ụra, n’ihi ya anaghị eli onye ọzọ mgbe a na-eme oriri ma ọ bụ 

agụgọ maka onye nze bụ onye agụgọ n’onwe ya. 

 

 

 

 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 58



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Ejiji onye chiri ọzọ na mpụtara 

Ejiji onye chiri ọzọ na-apụ iche, ma dịkwa asọ dị ka omenala ndị Igbo siri dị. Ofeke jiri ejiji ndị 

chiri ọzọ mere onwe ya arụsị apịara apịa n’ihi ndị nze ga-ada ya nha ma napụta ya ngwa ejiji ndị 

ahụ. 

 Ụfọdụ n’ime ejiji ndị nze na mpụtara ha:  

1. Okpu ndị ọzọ: Okpu ọzọ/nze pụtara na ọ ga-akaruo zeruo. 

Ndị nze nwere ụzọ dị iche ha si ekpu okpu nke na-egosi ọnọdụ dị iche iche ha hụrụ onwe 

ha. 

a. Okpu aka nri: Nke a na-ezipụta na ihe a na-eme bụ okwu ọma, okwu udo, ha ga-ekpula 

okpu ahụ aka nri 

b. Okpu aka ekpe: Nke a na-ezipụta na ihe a na-eme maọbụ a na-ekwu enweghị isi, mgbe 

nsogbu na-ada elu elu, ha nwere ike kpugharịa okpu ha n’aka ekpe. 

c. Okpu nọrọ n’azụ: Nke a na-ezipụta ihe ọjọọ, ọnwụ maọbụ mgbe ha gara ebe mmadụ 

nwụrụ, onye nze ọ bụla nọ ebe ahụ ga-ekpula okpu ya azụ 

d. Okpu nọrọ n’ihụ: O zipụtara na onye nze na-aga ikpe udo, ma ọ bụ ihe ọ bụla bụ ihe 

ọma. 

2. Ndị Nze na-agba Njata eriri n’ụkwụ n’olu, na n’aka. 

3 Akụpe: Nke ha ji efepu ihe ọjọọ ma febata ihe ọma 

7. Ọdụ onye nze: Nke a bụ opi ha ji ekele onwe ha tụmadị mgbe onye otu ha n’echi 

echimechi. 

8. Agada: Nke a bụ ọche onye nze na-eji aga nzukọ maọbụ ikpe. 

9. Akpa onye nze: Ha na-eji akpa nke gọsiri na onye nze kpeta ikpe ọma, ya fọnye n’akpa 

ya, ya kpeta ịkpe ọjọọ ha fọnyekwa n’akpa ya. 

 

Nze na ọzọ: N’ikwu eziokwu, nze na ọzọ bụ otu ihe. Onye chiri ọzọ abụrula nze. Nze na-eze ihi, 

ya bụ ize ihe ọjọọ, ọzọ na Nze na-aga, ebe nze na-eze ihe ọjọọ, ọzọ na-azọkwa ndụ. Onye chiri 

ọzọ ka a na-akpọ onye nze. 

 

 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 59



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

Ihe ọghọm  di n’echimechi ọzọ a chọpụtara: 

Ọzọ bụ ọdinala, bụrụkwa omenala Igbo kara aka mere o jiri bụrụ ihe no a nọ tupu ndị 

ọcha abịa. Ọzọ bụ echichi kacha nwee ugwu na nsopụrụ n’ala Igbo nke mere Igbo ji asi na ofeke 

lia ozọ ya chienu. ọtụtụ ihe nramahụ maọbụ ihe mkpọbi ụkwụ chere echichi ọzọ aka mgba ndi a 

chọpụtara gụnyere. 

1. Iwu na nsọ di n’echichi ọzọ kariri akari, nke a mere ọtụtụ mmadụ adịghị enwe ike idebe 

iwu ndi a atụrụ anya ka ha dobe. 

2. Ego  a na-emefu n’echichi ọzọ di ọtụtụ. 

3. A na-ele anya nke ọma tupu a nabata mmadu n’ihi ndị ọzọ bụ ndị a maara bụ ndị 

eziokwu, na- adịghị eri ngari. 

3. Ọtụtụ nnyọcha a, na-eru otu afọ maọbụ karịa. (iwe ọtutu oge) 

4. Omenala din a ya di otụtụ. 

5. Adịghị eji ọnụ akụta ọkwa ọzọ nke mere ndị ọzọ adịghị adị ubara. 

7. Ụfọdụ na-ebido emume ichi ọzọ, ha agaghị echicha ya ha anwụọ n’ihi ogologo oge ọ na-

enwe. 

8. Mgbe ụfọdụ ọzo na-abụkwa nsogbu nye ndị ezinaụlọ, o nwere ike bụtere ha ọnwụ n’ihi 

mmụọ na-eso ha tụmadị mgbe ha na-eme nke ọjọọ. 

 

Nchikọta  

Nchọcha a gbaliri imejupụta ebumnuche ya, site n’inye nkọwa rijuru afọ banyere ọzọ na usoro 

echichi ya. O gakwara n’ihu kọwachaa uru echichi ọzọ bara, ugwu na nsọpụrụ a na-enye onye 

chiri ọzọ nakwa nsọ di n’echichi ọzọ. Ederede a lebakwara anya n’ihe ndi ọzọ banyere ọzọ dika 

ekele onye chiri ọzọ, ekike onye chiri ọzọ, ọnwụ na olili onye chiri ọzọ. N’ikpeazụ, nchọcha a 

chọpụtara ihe ndi ahụ chere echichi ọzọ akamgba nke bụ isi a hụrụ kwaba okpu dika: igbu ewu 

ndi okenye, iga na dibie ajụ ase ma ọ bụrụ onye na-akpa agwa di anaa, imefu ọtụtụ ego site 

n’ikpọ oke oriri na ọnụnụ, igba njata, ida mmiri, igbu ichi, erighi nri nwaanyi nọ na nsọ siri, 

erighi nri n’ama, inwe ezigbo ego nakwa inwe mmụọ e ji eri ego. Ihe ndi a bụ akamgba chere 

echichi ọzọ n’ala Igbo.  

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 60



IJO- INTERNATIONAL JOURNAL OF SOCIAL SCIENCE AND HUMANITIES RESEARCH  
 ( ISSN 2811-2466 )                                                                Pauline Chinasa Nwizu * 

https://ijojournals.com/                                        Volume 07 || Issue 05 || May, 2024 || 

Akamgba chere echichi ọzọ n’ụzọ mmekọrịta omenala na akụnaụba n’ala Igbo dị ka o siri metụta ndị Ọlụ Gedegwum n’ọchịchị ime obodo Ọlụ n’oge ugbu a. 
 

 

 

 

A tụkwara elo ka e webilata ụfợdụ nsợ ndị a megidere mmekọrịta mmadụ na ibe 

ya n’echimechi ọzọ nakwa oke mmefu ego di na ya. E mee nke a, ọtụtụ ndi mmadụ ga-enwe 

mmasị n’ichi ọzọ. Nke a ga-akwalite ợnợdụ obibi ndu, ezi mmekọrịta nakwa mbawanye 

akụnaụba nke mba ụwa n’oge ugbu a. 

 

Nrụaka 

Ahamefule, I.C. (2015). Ọzọ title and Indigenous Capital Formation in Igbo Society, Southeast 
Nigeria, 1900-2015 

 
Anikwe, F.I. (2019). The Value of Ọzọ Insitution: Template for New Igbo Civilization. In N. 

Omenka, I. Ani & K. Obodoagu, (The Relevence of Higher Education to Human and 
National Development in Nigeria (pp 225-237). Enugu: JOMAP Press. 

 
Ngwu, I. (2011). Ukehe, Origin and Genelogy, Culture, Growth and Development. Nsukka, 

Chinedu Printing Press. 
 
Nwizu, P.C. Obiakor, E.E. Egonu, N.G. (2014) Nghota Asụsụ Igbo. A Second Language 

Learning (L2) Owerri: Hysab Prints & Publishers Ltd. 
Odigbo, I. (2012) Aspect of Igbo Cultures and Traditions: From the Prospective of Ụmụlumgbe 

Town Enugu: DULAC Press. 
 
Odigbo, I.M. (2023). Ọzọ title and Socio-Economic Recogniton in Igboland: A Philosophical 

Analysis Sapietia. Journal of Philosophy, 17. 
 

NDI A GBARA AJỤJỤ ỌNỤ 

 

 AHA AFỌ STEETI AKA ỌRỤ ỤBỌCHI 

1.  Nze Barr Fide Agusiegbe 89       Imo Retired 20/12/21 

2.  NZE Semeon Ụzọukwu 64 Imo Transporter 12/07/2023 

3.  Nze Cyprian Okereke 70 Imo Farmer 15/072023 

4.  Nze Sergius Ọhanenye 65  Imo Trader 20/08/2023 

 

IJO JOURNALS

Volume 07 | Issue 05 | May 2024 | https://ijojournals.com/index.php/ssh/index 61


